Native Bible

Hosea 9:3 · Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020

Ha agaghị anọgidekwa nʼala Onyenwe anyị, ma Ifrem ga-alaghachi nʼala Ijipt nọdụ nʼAsịrịa rie nri rụrụ arụ.

Hosea 9:3 in English

Hosea 9:3 · Berean Standard Bible

They will not remain in the land of the LORD; Ephraim * will return to Egypt and eat unclean food in Assyria.

Context

1Aṅụrịla ọṅụ, gị Izrel, ka obi ghara ịtọkwa gị ụtọ dịka ọ na-atọ ndị mba ọzọ, nʼihi na ị jụla Chineke gị, bido ịgba akwụna i hụrụ ụgwọ ọrụ ịkwa iko nʼanya nʼelu ebe ịzọcha ọka niile. 2Ebe ịzọcha mkpụrụ ọka na ebe ịzọcha mkpụrụ vaịnị agaghị azụ ha nri, mmanya ọhụrụ ga-agharịpụ ha. 3Ha agaghị anọgidekwa nʼala Onyenwe anyị, ma Ifrem ga-alaghachi nʼala Ijipt nọdụ nʼAsịrịa rie nri rụrụ arụ. 4Ha agaghị awụsa ihe ọṅụṅụ dịka aja nye Onyenwe anyị, nʼihi na ọdịghị aja ha ga-achụ ga-atọ ya ụtọ. Aja ndị a ga-adị ha ka nri nke ndị na-eru ụjụ si dị. Onye ọbụla riri nri ndị a ga-abụ onye na-adịghị ọcha. Nri ndị a ga-adịrị naanị ha onwe ha, ha agaghị ewebata ya nʼụlọnsọ ukwu Onyenwe anyị. 5Gịnị ọzọ ka unu ga-eme nʼụbọchị mmemme unu ndị ahụ a kara aka, ma nʼụbọchị mmemme nke Onyenwe anyị?

Igbo text and audio: Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™, made available under an open license by Biblica, Inc.