Hosiya 9:3
Hosea 9:3 · Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020
Ha agaghị anọgidekwa nʼala Onyenwe anyị, ma Ifrem ga-alaghachi nʼala Ijipt nọdụ nʼAsịrịa rie nri rụrụ arụ.
Hosea 9:3 in English
Hosea 9:3 · Berean Standard Bible
They will not remain in the land of the LORD; Ephraim * will return to Egypt and eat unclean food in Assyria.
Context
1Aṅụrịla ọṅụ, gị Izrel,
ka obi ghara ịtọkwa gị ụtọ dịka ọ na-atọ ndị mba ọzọ,
nʼihi na ị jụla Chineke gị, bido ịgba akwụna
i hụrụ ụgwọ ọrụ ịkwa iko nʼanya
nʼelu ebe ịzọcha ọka niile. 2Ebe ịzọcha mkpụrụ ọka na ebe ịzọcha mkpụrụ vaịnị agaghị azụ ha nri,
mmanya ọhụrụ ga-agharịpụ ha. 3Ha agaghị anọgidekwa nʼala Onyenwe anyị,
ma Ifrem ga-alaghachi nʼala Ijipt
nọdụ nʼAsịrịa rie nri rụrụ arụ. 4Ha agaghị awụsa ihe ọṅụṅụ dịka aja nye Onyenwe anyị,
nʼihi na ọdịghị aja ha ga-achụ ga-atọ ya ụtọ.
Aja ndị a ga-adị ha ka nri nke ndị na-eru ụjụ si dị.
Onye ọbụla riri nri ndị a ga-abụ onye na-adịghị ọcha.
Nri ndị a ga-adịrị naanị ha onwe ha,
ha agaghị ewebata ya nʼụlọnsọ ukwu Onyenwe anyị. 5Gịnị ọzọ ka unu ga-eme nʼụbọchị mmemme unu ndị ahụ a kara aka,
ma nʼụbọchị mmemme nke Onyenwe anyị?
Igbo text and audio: Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™, made available under an open license by Biblica, Inc.