Hosiya 9:2
Hosea 9:2 · Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020
Ebe ịzọcha mkpụrụ ọka na ebe ịzọcha mkpụrụ vaịnị agaghị azụ ha nri, mmanya ọhụrụ ga-agharịpụ ha.
Hosea 9:2 in English
Hosea 9:2 · Berean Standard Bible
The threshing floor and winepress will not feed them, and the new wine will fail them.
Context
1Aṅụrịla ọṅụ, gị Izrel,
ka obi ghara ịtọkwa gị ụtọ dịka ọ na-atọ ndị mba ọzọ,
nʼihi na ị jụla Chineke gị, bido ịgba akwụna
i hụrụ ụgwọ ọrụ ịkwa iko nʼanya
nʼelu ebe ịzọcha ọka niile. 2Ebe ịzọcha mkpụrụ ọka na ebe ịzọcha mkpụrụ vaịnị agaghị azụ ha nri,
mmanya ọhụrụ ga-agharịpụ ha. 3Ha agaghị anọgidekwa nʼala Onyenwe anyị,
ma Ifrem ga-alaghachi nʼala Ijipt
nọdụ nʼAsịrịa rie nri rụrụ arụ. 4Ha agaghị awụsa ihe ọṅụṅụ dịka aja nye Onyenwe anyị,
nʼihi na ọdịghị aja ha ga-achụ ga-atọ ya ụtọ.
Aja ndị a ga-adị ha ka nri nke ndị na-eru ụjụ si dị.
Onye ọbụla riri nri ndị a ga-abụ onye na-adịghị ọcha.
Nri ndị a ga-adịrị naanị ha onwe ha,
ha agaghị ewebata ya nʼụlọnsọ ukwu Onyenwe anyị.
Igbo text and audio: Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™, made available under an open license by Biblica, Inc.