Native Bible

Hosea 9:7 · Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020

Ụbọchị niile nke ntaramahụhụ* na-abịa, Ụbọchị ngụkọta ihe abịala nso. Ka Izrel mara nke a. Nʼihi na ịba ụba nke mmehie unu adịla ukwuu, nʼihi na ịkpọ asị unu akarịala, unu na-agụ onye amụma dịka onye nzuzu, na-agụkwa onye nwee Mmụọ nke Chineke dịka onye na-ayị ara.

Hosea 9:7 in English

Hosea 9:7 · Berean Standard Bible

The days of punishment have come; the days of retribution have arrived— let Israel know it. The prophet is called a fool, and the inspired man insane, because of the greatness of your iniquity and hostility.

Context

5Gịnị ọzọ ka unu ga-eme nʼụbọchị mmemme unu ndị ahụ a kara aka, ma nʼụbọchị mmemme nke Onyenwe anyị? 6A sịkwa na ha agbanarị mbibi, ndị Ijipt ga-achịkọta ha. Ndị Memfis ga-elikwa ha. Akụnụba nke ọlaọcha ha ka uke ga-ewekọrọ, ogwu na uke ga-etokwa nʼime ebe obibi ha niile, 7Ụbọchị niile nke ntaramahụhụ* na-abịa, Ụbọchị ngụkọta ihe abịala nso. Ka Izrel mara nke a. Nʼihi na ịba ụba nke mmehie unu adịla ukwuu, nʼihi na ịkpọ asị unu akarịala, unu na-agụ onye amụma dịka onye nzuzu, na-agụkwa onye nwee Mmụọ nke Chineke dịka onye na-ayị ara. 8Ma onye amụma bụ onye nche Chineke, na-eche Ifrem nche, ma igbudu nke ọnya jupụtara nʼụzọ ya niile, ịkpọ asị dịkwa nʼime nʼụlọnsọ Chineke ya. 9Ha emerụọla onwe ha ebe ọ dị ukwuu, dịka ọ dị nʼụbọchị Gibea. Ọ ga-echeta njehie ha. Ọ ga-enye ha ntaramahụhụ nʼihi mmehie ha niile.

Igbo text and audio: Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™, made available under an open license by Biblica, Inc.