Hosiya 9:7
Hosea 9:7 · Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020
Ụbọchị niile nke ntaramahụhụ* na-abịa, Ụbọchị ngụkọta ihe abịala nso. Ka Izrel mara nke a. Nʼihi na ịba ụba nke mmehie unu adịla ukwuu, nʼihi na ịkpọ asị unu akarịala, unu na-agụ onye amụma dịka onye nzuzu, na-agụkwa onye nwee Mmụọ nke Chineke dịka onye na-ayị ara.
Hosea 9:7 in English
Hosea 9:7 · Berean Standard Bible
The days of punishment have come; the days of retribution have arrived— let Israel know it. The prophet is called a fool, and the inspired man insane, because of the greatness of your iniquity and hostility.
Context
5Gịnị ọzọ ka unu ga-eme nʼụbọchị mmemme unu ndị ahụ a kara aka,
ma nʼụbọchị mmemme nke Onyenwe anyị? 6A sịkwa na ha agbanarị mbibi,
ndị Ijipt ga-achịkọta ha.
Ndị Memfis ga-elikwa ha.
Akụnụba nke ọlaọcha ha ka uke ga-ewekọrọ,
ogwu na uke ga-etokwa nʼime ebe obibi ha niile, 7Ụbọchị niile nke ntaramahụhụ* na-abịa,
Ụbọchị ngụkọta ihe abịala nso.
Ka Izrel mara nke a.
Nʼihi na ịba ụba nke mmehie unu adịla ukwuu,
nʼihi na ịkpọ asị unu akarịala,
unu na-agụ onye amụma dịka onye nzuzu,
na-agụkwa onye nwee Mmụọ nke Chineke dịka onye na-ayị ara. 8Ma onye amụma bụ onye nche Chineke,
na-eche Ifrem nche,
ma igbudu nke ọnya jupụtara nʼụzọ ya niile,
ịkpọ asị dịkwa nʼime nʼụlọnsọ Chineke ya. 9Ha emerụọla onwe ha ebe ọ dị ukwuu,
dịka ọ dị nʼụbọchị Gibea.
Ọ ga-echeta njehie ha.
Ọ ga-enye ha ntaramahụhụ nʼihi mmehie ha niile.
Igbo text and audio: Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™, made available under an open license by Biblica, Inc.