Hosiya 9:8
Hosea 9:8 · Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020
Ma onye amụma bụ onye nche Chineke, na-eche Ifrem nche, ma igbudu nke ọnya jupụtara nʼụzọ ya niile, ịkpọ asị dịkwa nʼime nʼụlọnsọ Chineke ya.
Hosea 9:8 in English
Hosea 9:8 · Berean Standard Bible
The prophet is Ephraim’s watchman, along with my God,* yet the snare of the fowler lies on all his paths. Hostility is in the house of his God!
Context
6A sịkwa na ha agbanarị mbibi,
ndị Ijipt ga-achịkọta ha.
Ndị Memfis ga-elikwa ha.
Akụnụba nke ọlaọcha ha ka uke ga-ewekọrọ,
ogwu na uke ga-etokwa nʼime ebe obibi ha niile, 7Ụbọchị niile nke ntaramahụhụ* na-abịa,
Ụbọchị ngụkọta ihe abịala nso.
Ka Izrel mara nke a.
Nʼihi na ịba ụba nke mmehie unu adịla ukwuu,
nʼihi na ịkpọ asị unu akarịala,
unu na-agụ onye amụma dịka onye nzuzu,
na-agụkwa onye nwee Mmụọ nke Chineke dịka onye na-ayị ara. 8Ma onye amụma bụ onye nche Chineke,
na-eche Ifrem nche,
ma igbudu nke ọnya jupụtara nʼụzọ ya niile,
ịkpọ asị dịkwa nʼime nʼụlọnsọ Chineke ya. 9Ha emerụọla onwe ha ebe ọ dị ukwuu,
dịka ọ dị nʼụbọchị Gibea.
Ọ ga-echeta njehie ha.
Ọ ga-enye ha ntaramahụhụ nʼihi mmehie ha niile. 10“Mgbe m chọtara Izrel,
ọ dị ka m chọtara mkpụrụ grepu nʼọzara;
mgbe m hụrụ nna nna unu ha,
ọ dị ka ihu mkpụrụ bụ ụzọ chaa nʼelu osisi fiig.
Ma mgbe ha bịaruru na Baal-Peoa,
ha doro onwe ha nsọ nyefee nʼaka arụsị ahụ na-eweta ihere,
si otu a ghọọ ndị rụrụ arụ, dịka ihe ndị ahụ ha hụrụ nʼanya si bụrụ ihe rụrụ arụ.
Igbo text and audio: Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™, made available under an open license by Biblica, Inc.