Hosiya 8:6
Hosea 8:6 · Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020
Ọ bụ nʼIzrel ka ha si. Ọ bụ onye na-akpụ ụzụ kpụrụ ya; ọ bụghị Chineke. A ga-akụrisikwa nwa ehi Sameria ahụ.
Hosea 8:6 in English
Hosea 8:6 · Berean Standard Bible
For this thing is from Israel— a craftsman made it, and it is not God. It will be broken to pieces, that calf of Samaria.
Context
4Ha meere onwe ha ndị eze, ma ha ajụtaghị m ase;
ha na-achọrọkwa ndị ọchịchị,* ma ghara ịjụta ase nʼaka m.
Ọlaọcha na ọlaedo ha
ka ha ji na-akpụrụ onwe ha arụsị,
nke ha ji ebibi onwe ha. 5Ajụla m arụsị nwa ehi a ị kpụrụ, O Sameria.
Nʼihi na ọnụma m na-ere ọkụ megide ha.
Ruo olee mgbe ka ha ga-anọ bụrụ ndị na-enweghị ike ịdị ọcha? 6Ọ bụ nʼIzrel ka ha si.
Ọ bụ onye na-akpụ ụzụ kpụrụ ya;
ọ bụghị Chineke.
A ga-akụrisikwa
nwa ehi Sameria ahụ. 7“Ha akụọla ifufe,
ha ga-aghọtakwa oke ifufe.
Osisi ọka ha na-eguzo
na-enweghị okpo ọka ọbụla.
A sịkwarị na ọ mịrị mkpụrụ,
ndị mba ọzọ ga-atapịa ya. 8Elodala Izrel!
Lee, ha nọ ugbu a nʼetiti ndị mba ọzọ
dịka mkpọkọrọ ite.
Igbo text and audio: Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™, made available under an open license by Biblica, Inc.