Hosiya 8:5
Hosea 8:5 · Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020
Ajụla m arụsị nwa ehi a ị kpụrụ, O Sameria. Nʼihi na ọnụma m na-ere ọkụ megide ha. Ruo olee mgbe ka ha ga-anọ bụrụ ndị na-enweghị ike ịdị ọcha?
Hosea 8:5 in English
Hosea 8:5 · Berean Standard Bible
He has rejected your calf,* O Samaria. My anger burns against them. How long will they be incapable of innocence?
Context
3Ma Izrel ajụla ihe dị mma.
Ugbu a, ndị iro ga-achụ ya ọsọ. 4Ha meere onwe ha ndị eze, ma ha ajụtaghị m ase;
ha na-achọrọkwa ndị ọchịchị,* ma ghara ịjụta ase nʼaka m.
Ọlaọcha na ọlaedo ha
ka ha ji na-akpụrụ onwe ha arụsị,
nke ha ji ebibi onwe ha. 5Ajụla m arụsị nwa ehi a ị kpụrụ, O Sameria.
Nʼihi na ọnụma m na-ere ọkụ megide ha.
Ruo olee mgbe ka ha ga-anọ bụrụ ndị na-enweghị ike ịdị ọcha? 6Ọ bụ nʼIzrel ka ha si.
Ọ bụ onye na-akpụ ụzụ kpụrụ ya;
ọ bụghị Chineke.
A ga-akụrisikwa
nwa ehi Sameria ahụ. 7“Ha akụọla ifufe,
ha ga-aghọtakwa oke ifufe.
Osisi ọka ha na-eguzo
na-enweghị okpo ọka ọbụla.
A sịkwarị na ọ mịrị mkpụrụ,
ndị mba ọzọ ga-atapịa ya.
Igbo text and audio: Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™, made available under an open license by Biblica, Inc.