Hosiya 8:4
Hosea 8:4 · Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020
Ha meere onwe ha ndị eze, ma ha ajụtaghị m ase; ha na-achọrọkwa ndị ọchịchị,* ma ghara ịjụta ase nʼaka m. Ọlaọcha na ọlaedo ha ka ha ji na-akpụrụ onwe ha arụsị, nke ha ji ebibi onwe ha.
Hosea 8:4 in English
Hosea 8:4 · Berean Standard Bible
They set up kings, but not by Me. They make princes, but without My approval. With their silver and gold they make themselves idols, to their own destruction.
Context
2Ugbu a ndị Izrel na-etiku m mkpu akwa,
‘Chineke anyị, anyị bụ Izrel maara gị.’ 3Ma Izrel ajụla ihe dị mma.
Ugbu a, ndị iro ga-achụ ya ọsọ. 4Ha meere onwe ha ndị eze, ma ha ajụtaghị m ase;
ha na-achọrọkwa ndị ọchịchị,* ma ghara ịjụta ase nʼaka m.
Ọlaọcha na ọlaedo ha
ka ha ji na-akpụrụ onwe ha arụsị,
nke ha ji ebibi onwe ha. 5Ajụla m arụsị nwa ehi a ị kpụrụ, O Sameria.
Nʼihi na ọnụma m na-ere ọkụ megide ha.
Ruo olee mgbe ka ha ga-anọ bụrụ ndị na-enweghị ike ịdị ọcha? 6Ọ bụ nʼIzrel ka ha si.
Ọ bụ onye na-akpụ ụzụ kpụrụ ya;
ọ bụghị Chineke.
A ga-akụrisikwa
nwa ehi Sameria ahụ.
Igbo text and audio: Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™, made available under an open license by Biblica, Inc.