Native Bible

Hosea 8:3 · Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020

Ma Izrel ajụla ihe dị mma. Ugbu a, ndị iro ga-achụ ya ọsọ.

Hosea 8:3 in English

Hosea 8:3 · Berean Standard Bible

But Israel has rejected good; an enemy will pursue him.

Context

1“Tinye opi ike nʼọnụ gị! Nʼihi na ugo nʼefefe nʼelu ụlọ Onyenwe anyị, nʼihi na ha emebiela ọgbụgba ndụ m, nupu isi megide iwu m. 2Ugbu a ndị Izrel na-etiku m mkpu akwa, ‘Chineke anyị, anyị bụ Izrel maara gị.’ 3Ma Izrel ajụla ihe dị mma. Ugbu a, ndị iro ga-achụ ya ọsọ. 4Ha meere onwe ha ndị eze, ma ha ajụtaghị m ase; ha na-achọrọkwa ndị ọchịchị,* ma ghara ịjụta ase nʼaka m. Ọlaọcha na ọlaedo ha ka ha ji na-akpụrụ onwe ha arụsị, nke ha ji ebibi onwe ha. 5Ajụla m arụsị nwa ehi a ị kpụrụ, O Sameria. Nʼihi na ọnụma m na-ere ọkụ megide ha. Ruo olee mgbe ka ha ga-anọ bụrụ ndị na-enweghị ike ịdị ọcha?

Igbo text and audio: Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™, made available under an open license by Biblica, Inc.