Hosiya 8:7
Hosea 8:7 · Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020
“Ha akụọla ifufe, ha ga-aghọtakwa oke ifufe. Osisi ọka ha na-eguzo na-enweghị okpo ọka ọbụla. A sịkwarị na ọ mịrị mkpụrụ, ndị mba ọzọ ga-atapịa ya.
Hosea 8:7 in English
Hosea 8:7 · Berean Standard Bible
For they sow the wind, and they shall reap the whirlwind. There is no standing grain; what sprouts fails to yield flour. Even if it should produce, the foreigners would swallow it up.
Context
5Ajụla m arụsị nwa ehi a ị kpụrụ, O Sameria.
Nʼihi na ọnụma m na-ere ọkụ megide ha.
Ruo olee mgbe ka ha ga-anọ bụrụ ndị na-enweghị ike ịdị ọcha? 6Ọ bụ nʼIzrel ka ha si.
Ọ bụ onye na-akpụ ụzụ kpụrụ ya;
ọ bụghị Chineke.
A ga-akụrisikwa
nwa ehi Sameria ahụ. 7“Ha akụọla ifufe,
ha ga-aghọtakwa oke ifufe.
Osisi ọka ha na-eguzo
na-enweghị okpo ọka ọbụla.
A sịkwarị na ọ mịrị mkpụrụ,
ndị mba ọzọ ga-atapịa ya. 8Elodala Izrel!
Lee, ha nọ ugbu a nʼetiti ndị mba ọzọ
dịka mkpọkọrọ ite. 9Nʼihi na ha ejeela Asịrịa
dịka ịnyịnya ibu ọhịa na-awagharị naanị ya.
Ifrem ewerela onwe ya resi ndị enyi ya.
Igbo text and audio: Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™, made available under an open license by Biblica, Inc.