Native Bible

Hosea 8:9 · Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020

Nʼihi na ha ejeela Asịrịa dịka ịnyịnya ibu ọhịa na-awagharị naanị ya. Ifrem ewerela onwe ya resi ndị enyi ya.

Hosea 8:9 in English

Hosea 8:9 · Berean Standard Bible

For they have gone up to Assyria like a wild donkey on its own. Ephraim * has hired lovers.

Context

7“Ha akụọla ifufe, ha ga-aghọtakwa oke ifufe. Osisi ọka ha na-eguzo na-enweghị okpo ọka ọbụla. A sịkwarị na ọ mịrị mkpụrụ, ndị mba ọzọ ga-atapịa ya. 8Elodala Izrel! Lee, ha nọ ugbu a nʼetiti ndị mba ọzọ dịka mkpọkọrọ ite. 9Nʼihi na ha ejeela Asịrịa dịka ịnyịnya ibu ọhịa na-awagharị naanị ya. Ifrem ewerela onwe ya resi ndị enyi ya. 10Ọ bụ ezie na ha ewerela onwe ha resi ọtụtụ mba dị iche iche, aga m achịkọta ha. Ha ga-atakwa ahụ nʼihi ọnọdụ mmegbu nke eze na ndịisi ga-achị ha. 11“Nʼihi na Ifrem ewuola ọtụtụ ebe nchụaja maka ịchụ aja mmehie, ebe nchụaja ndị a abụrụla ebe a na-eme mmehie.

Igbo text and audio: Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™, made available under an open license by Biblica, Inc.