Hosiya 8:9
Hosea 8:9 · Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020
Nʼihi na ha ejeela Asịrịa dịka ịnyịnya ibu ọhịa na-awagharị naanị ya. Ifrem ewerela onwe ya resi ndị enyi ya.
Hosea 8:9 in English
Hosea 8:9 · Berean Standard Bible
For they have gone up to Assyria like a wild donkey on its own. Ephraim * has hired lovers.
Context
7“Ha akụọla ifufe,
ha ga-aghọtakwa oke ifufe.
Osisi ọka ha na-eguzo
na-enweghị okpo ọka ọbụla.
A sịkwarị na ọ mịrị mkpụrụ,
ndị mba ọzọ ga-atapịa ya. 8Elodala Izrel!
Lee, ha nọ ugbu a nʼetiti ndị mba ọzọ
dịka mkpọkọrọ ite. 9Nʼihi na ha ejeela Asịrịa
dịka ịnyịnya ibu ọhịa na-awagharị naanị ya.
Ifrem ewerela onwe ya resi ndị enyi ya. 10Ọ bụ ezie na ha ewerela onwe ha resi ọtụtụ mba dị iche iche,
aga m achịkọta ha.
Ha ga-atakwa ahụ
nʼihi ọnọdụ mmegbu nke eze na ndịisi ga-achị ha. 11“Nʼihi na Ifrem ewuola ọtụtụ ebe nchụaja maka ịchụ aja mmehie,
ebe nchụaja ndị a abụrụla ebe a na-eme mmehie.
Igbo text and audio: Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™, made available under an open license by Biblica, Inc.