Native Bible

Hosea 8:11 · Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020

“Nʼihi na Ifrem ewuola ọtụtụ ebe nchụaja maka ịchụ aja mmehie, ebe nchụaja ndị a abụrụla ebe a na-eme mmehie.

Hosea 8:11 in English

Hosea 8:11 · Berean Standard Bible

Though Ephraim multiplied the altars for sin, they became his altars for sinning.

Context

9Nʼihi na ha ejeela Asịrịa dịka ịnyịnya ibu ọhịa na-awagharị naanị ya. Ifrem ewerela onwe ya resi ndị enyi ya. 10Ọ bụ ezie na ha ewerela onwe ha resi ọtụtụ mba dị iche iche, aga m achịkọta ha. Ha ga-atakwa ahụ nʼihi ọnọdụ mmegbu nke eze na ndịisi ga-achị ha. 11“Nʼihi na Ifrem ewuola ọtụtụ ebe nchụaja maka ịchụ aja mmehie, ebe nchụaja ndị a abụrụla ebe a na-eme mmehie. 12E depụtaara m ha ọtụtụ ihe banyere iwu m, ma ha were ya dịka ihe e si na mba ọzọ webata. 13Ha na-achụ aja dịka onyinye nye m, ha na-erikwa anụ ndị ahụ ha jiri chụọ aja, ma na Onyenwe anyị enweghị mmasị nʼebe aja ha dị. Ugbu a, ọ ga-echeta ajọ omume ha, nye ha ntaramahụhụ nʼihi mmehie niile ha, ha ga-alaghachi nʼIjipt.

Igbo text and audio: Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™, made available under an open license by Biblica, Inc.