Hosiya 8:11
Hosea 8:11 · Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020
“Nʼihi na Ifrem ewuola ọtụtụ ebe nchụaja maka ịchụ aja mmehie, ebe nchụaja ndị a abụrụla ebe a na-eme mmehie.
Hosea 8:11 in English
Hosea 8:11 · Berean Standard Bible
Though Ephraim multiplied the altars for sin, they became his altars for sinning.
Context
9Nʼihi na ha ejeela Asịrịa
dịka ịnyịnya ibu ọhịa na-awagharị naanị ya.
Ifrem ewerela onwe ya resi ndị enyi ya. 10Ọ bụ ezie na ha ewerela onwe ha resi ọtụtụ mba dị iche iche,
aga m achịkọta ha.
Ha ga-atakwa ahụ
nʼihi ọnọdụ mmegbu nke eze na ndịisi ga-achị ha. 11“Nʼihi na Ifrem ewuola ọtụtụ ebe nchụaja maka ịchụ aja mmehie,
ebe nchụaja ndị a abụrụla ebe a na-eme mmehie. 12E depụtaara m ha ọtụtụ ihe banyere iwu m,
ma ha were ya dịka ihe e si na mba ọzọ webata. 13Ha na-achụ aja dịka onyinye nye m,
ha na-erikwa anụ ndị ahụ ha jiri chụọ aja,
ma na Onyenwe anyị enweghị mmasị nʼebe aja ha dị.
Ugbu a, ọ ga-echeta ajọ omume ha,
nye ha ntaramahụhụ nʼihi mmehie niile ha,
ha ga-alaghachi nʼIjipt.
Igbo text and audio: Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™, made available under an open license by Biblica, Inc.