Hosiya 7:5
Hosea 7:5 · Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020
Nʼụbọchị mmemme nke eze anyị, ụmụ eze bụ ndị akpalịrị site na-ịṅụbiga mmanya oke, ya na ndị na-akwa emo jikọtara aka.
Hosea 7:5 in English
Hosea 7:5 · Berean Standard Bible
The princes are inflamed with wine on the day of our king; so he joins hands with those who mock him.
Context
3“Eze ha na-aṅụrị ọṅụ nʼihe ọjọọ ha;
ụmụ eze na-achị ọchị nʼihi ụgha ha. 4Ha niile bụ ndị na-akwa iko;
ha dị ka ite ọkụ ighe achịcha e mere ka ọ dị ọkụ,
nke onye na-eghe achịcha na-adịghị akwanye nkụ,
site na mgbe e bidoro ịgwakọ ụtụ ọka ahụ tutu ruo mgbe o koliri. 5Nʼụbọchị mmemme nke eze anyị,
ụmụ eze bụ ndị akpalịrị site na-ịṅụbiga mmanya oke,
ya na ndị na-akwa emo jikọtara aka. 6Obi ha na-enwu ọkụ dịka ihe ighe achịcha,
ha ji izu nzuzo na-abịakwute ya.
Nʼabalị niile iwe ha na-ere nwayọọ ka ọkụ na-anyụ anyụ,
nʼụtụtụ ihe ha gbatara nʼizu na-enwu dịka ọkụ. 7Ha niile dị ọkụ dịka ite ighe achịcha dị ọkụ.
Ha na-eripịa ndị eze ha.
Ndị eze ha niile na-ada,
ma o nweghị onye nʼime ha na-akpọku m.
Igbo text and audio: Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™, made available under an open license by Biblica, Inc.