Hosiya 7:4
Hosea 7:4 · Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020
Ha niile bụ ndị na-akwa iko; ha dị ka ite ọkụ ighe achịcha e mere ka ọ dị ọkụ, nke onye na-eghe achịcha na-adịghị akwanye nkụ, site na mgbe e bidoro ịgwakọ ụtụ ọka ahụ tutu ruo mgbe o koliri.
Hosea 7:4 in English
Hosea 7:4 · Berean Standard Bible
They are all adulterers, like an oven heated by a baker who needs not stoke the fire from the kneading to the rising of the dough.
Context
2Ọ dịghị onye bi nʼime ha maara
na m na-echeta mmehie ha niile.
Ugbu a, mmehie ha agbaala ha gburugburu.
Ana m ahụkwa ha niile. 3“Eze ha na-aṅụrị ọṅụ nʼihe ọjọọ ha;
ụmụ eze na-achị ọchị nʼihi ụgha ha. 4Ha niile bụ ndị na-akwa iko;
ha dị ka ite ọkụ ighe achịcha e mere ka ọ dị ọkụ,
nke onye na-eghe achịcha na-adịghị akwanye nkụ,
site na mgbe e bidoro ịgwakọ ụtụ ọka ahụ tutu ruo mgbe o koliri. 5Nʼụbọchị mmemme nke eze anyị,
ụmụ eze bụ ndị akpalịrị site na-ịṅụbiga mmanya oke,
ya na ndị na-akwa emo jikọtara aka. 6Obi ha na-enwu ọkụ dịka ihe ighe achịcha,
ha ji izu nzuzo na-abịakwute ya.
Nʼabalị niile iwe ha na-ere nwayọọ ka ọkụ na-anyụ anyụ,
nʼụtụtụ ihe ha gbatara nʼizu na-enwu dịka ọkụ.
Igbo text and audio: Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™, made available under an open license by Biblica, Inc.