Hosiya 7:6
Hosea 7:6 · Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020
Obi ha na-enwu ọkụ dịka ihe ighe achịcha, ha ji izu nzuzo na-abịakwute ya. Nʼabalị niile iwe ha na-ere nwayọọ ka ọkụ na-anyụ anyụ, nʼụtụtụ ihe ha gbatara nʼizu na-enwu dịka ọkụ.
Hosea 7:6 in English
Hosea 7:6 · Berean Standard Bible
For they prepare their heart like an oven while they lie in wait; all night their anger smolders;* in the morning it blazes like a flaming fire.
Context
4Ha niile bụ ndị na-akwa iko;
ha dị ka ite ọkụ ighe achịcha e mere ka ọ dị ọkụ,
nke onye na-eghe achịcha na-adịghị akwanye nkụ,
site na mgbe e bidoro ịgwakọ ụtụ ọka ahụ tutu ruo mgbe o koliri. 5Nʼụbọchị mmemme nke eze anyị,
ụmụ eze bụ ndị akpalịrị site na-ịṅụbiga mmanya oke,
ya na ndị na-akwa emo jikọtara aka. 6Obi ha na-enwu ọkụ dịka ihe ighe achịcha,
ha ji izu nzuzo na-abịakwute ya.
Nʼabalị niile iwe ha na-ere nwayọọ ka ọkụ na-anyụ anyụ,
nʼụtụtụ ihe ha gbatara nʼizu na-enwu dịka ọkụ. 7Ha niile dị ọkụ dịka ite ighe achịcha dị ọkụ.
Ha na-eripịa ndị eze ha.
Ndị eze ha niile na-ada,
ma o nweghị onye nʼime ha na-akpọku m. 8“Ifrem na-agwakọta onwe ya nʼetiti ndị mba ọzọ.
Ifrem dịkwa ka mbadamba achịcha a na-atụgharịghị atụgharị.
Igbo text and audio: Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™, made available under an open license by Biblica, Inc.