Hosiya 7:8
Hosea 7:8 · Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020
“Ifrem na-agwakọta onwe ya nʼetiti ndị mba ọzọ. Ifrem dịkwa ka mbadamba achịcha a na-atụgharịghị atụgharị.
Hosea 7:8 in English
Hosea 7:8 · Berean Standard Bible
Ephraim mixes with the nations; Ephraim is an unturned cake.
Context
6Obi ha na-enwu ọkụ dịka ihe ighe achịcha,
ha ji izu nzuzo na-abịakwute ya.
Nʼabalị niile iwe ha na-ere nwayọọ ka ọkụ na-anyụ anyụ,
nʼụtụtụ ihe ha gbatara nʼizu na-enwu dịka ọkụ. 7Ha niile dị ọkụ dịka ite ighe achịcha dị ọkụ.
Ha na-eripịa ndị eze ha.
Ndị eze ha niile na-ada,
ma o nweghị onye nʼime ha na-akpọku m. 8“Ifrem na-agwakọta onwe ya nʼetiti ndị mba ọzọ.
Ifrem dịkwa ka mbadamba achịcha a na-atụgharịghị atụgharị. 9Ndị mba ọzọ na-eripịa ike ha,
ma ha adịghị aghọta ya.
Isi awọ apụtala ha nʼisi,
ma ya onwe ya amaghị na o si otu a dịrị. 10Ịnya isi Izrel na-agba akaebe megide ya
ma nʼagbanyeghị ihe ndị a
ọ naghị alọghachikwute Onyenwe anyị bụ Chineke ya,
maọbụ chọọ ya.
Igbo text and audio: Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™, made available under an open license by Biblica, Inc.