Native Bible

Hosea 7:10 · Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020

Ịnya isi Izrel na-agba akaebe megide ya ma nʼagbanyeghị ihe ndị a ọ naghị alọghachikwute Onyenwe anyị bụ Chineke ya, maọbụ chọọ ya.

Hosea 7:10 in English

Hosea 7:10 · Berean Standard Bible

Israel’s arrogance testifies against them, yet they do not return to the LORD their God; despite all this, they do not seek Him.

Context

8“Ifrem na-agwakọta onwe ya nʼetiti ndị mba ọzọ. Ifrem dịkwa ka mbadamba achịcha a na-atụgharịghị atụgharị. 9Ndị mba ọzọ na-eripịa ike ha, ma ha adịghị aghọta ya. Isi awọ apụtala ha nʼisi, ma ya onwe ya amaghị na o si otu a dịrị. 10Ịnya isi Izrel na-agba akaebe megide ya ma nʼagbanyeghị ihe ndị a ọ naghị alọghachikwute Onyenwe anyị bụ Chineke ya, maọbụ chọọ ya. 11“Ifrem dịka nduru nke na-enweghị uche, nke onye ọbụla na-eduhie, ugbu a, ọ na-akpọku Ijipt, ma na-agbakwurukwa Asịrịa. 12Ma mgbe ha na-agbagharị, aga m ewere ụgbụ m jide ha, dọda ha nʼala dịka nnụnụ e jidere na mbara eluigwe. Aga m enye ha ahụhụ nʼihi njehie ha niile.

Igbo text and audio: Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™, made available under an open license by Biblica, Inc.