Hosiya 7:10
Hosea 7:10 · Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020
Ịnya isi Izrel na-agba akaebe megide ya ma nʼagbanyeghị ihe ndị a ọ naghị alọghachikwute Onyenwe anyị bụ Chineke ya, maọbụ chọọ ya.
Hosea 7:10 in English
Hosea 7:10 · Berean Standard Bible
Israel’s arrogance testifies against them, yet they do not return to the LORD their God; despite all this, they do not seek Him.
Context
8“Ifrem na-agwakọta onwe ya nʼetiti ndị mba ọzọ.
Ifrem dịkwa ka mbadamba achịcha a na-atụgharịghị atụgharị. 9Ndị mba ọzọ na-eripịa ike ha,
ma ha adịghị aghọta ya.
Isi awọ apụtala ha nʼisi,
ma ya onwe ya amaghị na o si otu a dịrị. 10Ịnya isi Izrel na-agba akaebe megide ya
ma nʼagbanyeghị ihe ndị a
ọ naghị alọghachikwute Onyenwe anyị bụ Chineke ya,
maọbụ chọọ ya. 11“Ifrem dịka nduru
nke na-enweghị uche, nke onye ọbụla na-eduhie,
ugbu a, ọ na-akpọku Ijipt,
ma na-agbakwurukwa Asịrịa. 12Ma mgbe ha na-agbagharị, aga m ewere ụgbụ m jide ha,
dọda ha nʼala dịka nnụnụ e jidere na mbara eluigwe.
Aga m enye ha ahụhụ
nʼihi njehie ha niile.
Igbo text and audio: Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™, made available under an open license by Biblica, Inc.