Hosiya 7:11
Hosea 7:11 · Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020
“Ifrem dịka nduru nke na-enweghị uche, nke onye ọbụla na-eduhie, ugbu a, ọ na-akpọku Ijipt, ma na-agbakwurukwa Asịrịa.
Hosea 7:11 in English
Hosea 7:11 · Berean Standard Bible
So Ephraim has become like a silly, senseless dove— calling out to Egypt, then turning to Assyria.
Context
9Ndị mba ọzọ na-eripịa ike ha,
ma ha adịghị aghọta ya.
Isi awọ apụtala ha nʼisi,
ma ya onwe ya amaghị na o si otu a dịrị. 10Ịnya isi Izrel na-agba akaebe megide ya
ma nʼagbanyeghị ihe ndị a
ọ naghị alọghachikwute Onyenwe anyị bụ Chineke ya,
maọbụ chọọ ya. 11“Ifrem dịka nduru
nke na-enweghị uche, nke onye ọbụla na-eduhie,
ugbu a, ọ na-akpọku Ijipt,
ma na-agbakwurukwa Asịrịa. 12Ma mgbe ha na-agbagharị, aga m ewere ụgbụ m jide ha,
dọda ha nʼala dịka nnụnụ e jidere na mbara eluigwe.
Aga m enye ha ahụhụ
nʼihi njehie ha niile. 13Ahụhụ na-adịrị ha,
nʼihi na ha ajụla m.
Ha na-ala nʼiyi
nʼihi na ha enupula isi ha megide m.
Achọrọ m ka m gbapụta ha,
ma ha na-agha ụgha megide m.
Igbo text and audio: Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™, made available under an open license by Biblica, Inc.