Native Bible

Hosea 7:12 · Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020

Ma mgbe ha na-agbagharị, aga m ewere ụgbụ m jide ha, dọda ha nʼala dịka nnụnụ e jidere na mbara eluigwe. Aga m enye ha ahụhụ nʼihi njehie ha niile.

Hosea 7:12 in English

Hosea 7:12 · Berean Standard Bible

As they go, I will spread My net over them; I will bring them down like birds of the air. I will chastise them when I hear them flocking together.*

Context

10Ịnya isi Izrel na-agba akaebe megide ya ma nʼagbanyeghị ihe ndị a ọ naghị alọghachikwute Onyenwe anyị bụ Chineke ya, maọbụ chọọ ya. 11“Ifrem dịka nduru nke na-enweghị uche, nke onye ọbụla na-eduhie, ugbu a, ọ na-akpọku Ijipt, ma na-agbakwurukwa Asịrịa. 12Ma mgbe ha na-agbagharị, aga m ewere ụgbụ m jide ha, dọda ha nʼala dịka nnụnụ e jidere na mbara eluigwe. Aga m enye ha ahụhụ nʼihi njehie ha niile. 13Ahụhụ na-adịrị ha, nʼihi na ha ajụla m. Ha na-ala nʼiyi nʼihi na ha enupula isi ha megide m. Achọrọ m ka m gbapụta ha, ma ha na-agha ụgha megide m. 14Ha ejighịkwa obi ha akpọku m, kama ha na-atụrụ onwe ha nʼelu ihe ndina ha, na-eti mkpu akwa. Mgbe ha na-arịọ arịrịọ maka mkpụrụ ubi na mmanya, ha na-egbukasị onwe ha ahụ, na-ewezugakwa onwe ha site nʼebe m nọ.

Igbo text and audio: Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™, made available under an open license by Biblica, Inc.