Hosiya 7:12
Hosea 7:12 · Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020
Ma mgbe ha na-agbagharị, aga m ewere ụgbụ m jide ha, dọda ha nʼala dịka nnụnụ e jidere na mbara eluigwe. Aga m enye ha ahụhụ nʼihi njehie ha niile.
Hosea 7:12 in English
Hosea 7:12 · Berean Standard Bible
As they go, I will spread My net over them; I will bring them down like birds of the air. I will chastise them when I hear them flocking together.*
Context
10Ịnya isi Izrel na-agba akaebe megide ya
ma nʼagbanyeghị ihe ndị a
ọ naghị alọghachikwute Onyenwe anyị bụ Chineke ya,
maọbụ chọọ ya. 11“Ifrem dịka nduru
nke na-enweghị uche, nke onye ọbụla na-eduhie,
ugbu a, ọ na-akpọku Ijipt,
ma na-agbakwurukwa Asịrịa. 12Ma mgbe ha na-agbagharị, aga m ewere ụgbụ m jide ha,
dọda ha nʼala dịka nnụnụ e jidere na mbara eluigwe.
Aga m enye ha ahụhụ
nʼihi njehie ha niile. 13Ahụhụ na-adịrị ha,
nʼihi na ha ajụla m.
Ha na-ala nʼiyi
nʼihi na ha enupula isi ha megide m.
Achọrọ m ka m gbapụta ha,
ma ha na-agha ụgha megide m. 14Ha ejighịkwa obi ha akpọku m,
kama ha na-atụrụ onwe ha nʼelu ihe ndina ha, na-eti mkpu akwa.
Mgbe ha na-arịọ arịrịọ maka mkpụrụ ubi na mmanya,
ha na-egbukasị onwe ha ahụ,
na-ewezugakwa onwe ha site nʼebe m nọ.
Igbo text and audio: Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™, made available under an open license by Biblica, Inc.