Hosiya 7:13
Hosea 7:13 · Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020
Ahụhụ na-adịrị ha, nʼihi na ha ajụla m. Ha na-ala nʼiyi nʼihi na ha enupula isi ha megide m. Achọrọ m ka m gbapụta ha, ma ha na-agha ụgha megide m.
Hosea 7:13 in English
Hosea 7:13 · Berean Standard Bible
Woe to them, for they have strayed from Me! Destruction to them, for they have rebelled against Me! Though I would redeem them, they speak lies against Me.
Context
11“Ifrem dịka nduru
nke na-enweghị uche, nke onye ọbụla na-eduhie,
ugbu a, ọ na-akpọku Ijipt,
ma na-agbakwurukwa Asịrịa. 12Ma mgbe ha na-agbagharị, aga m ewere ụgbụ m jide ha,
dọda ha nʼala dịka nnụnụ e jidere na mbara eluigwe.
Aga m enye ha ahụhụ
nʼihi njehie ha niile. 13Ahụhụ na-adịrị ha,
nʼihi na ha ajụla m.
Ha na-ala nʼiyi
nʼihi na ha enupula isi ha megide m.
Achọrọ m ka m gbapụta ha,
ma ha na-agha ụgha megide m. 14Ha ejighịkwa obi ha akpọku m,
kama ha na-atụrụ onwe ha nʼelu ihe ndina ha, na-eti mkpu akwa.
Mgbe ha na-arịọ arịrịọ maka mkpụrụ ubi na mmanya,
ha na-egbukasị onwe ha ahụ,
na-ewezugakwa onwe ha site nʼebe m nọ. 15Enyerela m ha aka, mee ka ha dị ike,
ma ha atụgharịala gbaa izu imegide m.
Igbo text and audio: Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™, made available under an open license by Biblica, Inc.