Hosiya 7:2
Hosea 7:2 · Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020
Ọ dịghị onye bi nʼime ha maara na m na-echeta mmehie ha niile. Ugbu a, mmehie ha agbaala ha gburugburu. Ana m ahụkwa ha niile.
Hosea 7:2 in English
Hosea 7:2 · Berean Standard Bible
But they fail to consider in their hearts that I remember all their evil. Now their deeds are all around them; they are before My face.
Context
1mgbe m chọrọ ịgwọ Izrel,
mmehie Ifrem na-apụta ihe,
a na-ekpughekwa arụ a na-eme na Sameria.
Ha na-aghọ aghụghọ,
ndị ohi na-akụwakwa ụlọ ndị mmadụ,
ndị na-apụnara mmadụ ihe nọ nʼokporoụzọ. 2Ọ dịghị onye bi nʼime ha maara
na m na-echeta mmehie ha niile.
Ugbu a, mmehie ha agbaala ha gburugburu.
Ana m ahụkwa ha niile. 3“Eze ha na-aṅụrị ọṅụ nʼihe ọjọọ ha;
ụmụ eze na-achị ọchị nʼihi ụgha ha. 4Ha niile bụ ndị na-akwa iko;
ha dị ka ite ọkụ ighe achịcha e mere ka ọ dị ọkụ,
nke onye na-eghe achịcha na-adịghị akwanye nkụ,
site na mgbe e bidoro ịgwakọ ụtụ ọka ahụ tutu ruo mgbe o koliri.
Igbo text and audio: Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™, made available under an open license by Biblica, Inc.