Hosiya 2:4
Hosea 2:4 · Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020
Agaghị m egosi ụmụ ya ebere m, nʼihi na ha bụ ụmụ a kwatara nʼiko.
Hosea 2:4 in English
Hosea 2:4 · Berean Standard Bible
I will have no compassion on her children, because they are the children of adultery.
Context
2“Unu guzogidenụ nne unu, rịọọnụ ya,
nʼihi na ọ bụghị nwunye m,
mụ onwe m abụkwaghị di ya.
Gwanụ ya ka o wezuga ịkwa iko site nʼihu ya,
ya wezugakwa ịgba akwụna nke dị nʼetiti ara ya abụọ. 3Ma ọ bụghị otu a, aga m eyipụ ya uwe ya mee ka ọ gbara ọtọ,
aga m eme ka o gbara ọtọ dị ka nʼụbọchị ahụ a mụrụ ya.
Aga m eme ya ka ọ dị ka ọzara,
ka ọ ghọọ nʼala kpọrọ nkụ,
were akpịrị ịkpọ nkụ mee ka ọ nwụọ. 4Agaghị m egosi ụmụ ya ebere m,
nʼihi na ha bụ ụmụ a kwatara nʼiko. 5Nʼihi na nne ha bụ onye na-akwa iko,
ọ tụrụ ime ha nʼọnọdụ ihere.
Site nʼikwu sị, ‘Aghaghị m ịgbakwuru ndị enyi nwoke hụrụ m nʼanya,
ndị na-enye m nri na mmiri,
ajị anụ m na akwa ọcha m, mmanụ oliv m na ihe ọṅụṅụ m.’ 6Nʼihi nke a, aga m eji ogwu na uke gbachie ya gburugburu;
aga m agbachi ụzọ ya, mee ya ka ọ ghara ịma ebe ọ na-eje.
Igbo text and audio: Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™, made available under an open license by Biblica, Inc.