Native Bible

Hosea 2:5 · Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020

Nʼihi na nne ha bụ onye na-akwa iko, ọ tụrụ ime ha nʼọnọdụ ihere. Site nʼikwu sị, ‘Aghaghị m ịgbakwuru ndị enyi nwoke hụrụ m nʼanya, ndị na-enye m nri na mmiri, ajị anụ m na akwa ọcha m, mmanụ oliv m na ihe ọṅụṅụ m.’

Hosea 2:5 in English

Hosea 2:5 · Berean Standard Bible

For their mother has played the harlot and has conceived them in disgrace. For she thought, ‘I will go after my lovers, who give me bread and water, wool and linen, oil and drink.’

Context

3Ma ọ bụghị otu a, aga m eyipụ ya uwe ya mee ka ọ gbara ọtọ, aga m eme ka o gbara ọtọ dị ka nʼụbọchị ahụ a mụrụ ya. Aga m eme ya ka ọ dị ka ọzara, ka ọ ghọọ nʼala kpọrọ nkụ, were akpịrị ịkpọ nkụ mee ka ọ nwụọ. 4Agaghị m egosi ụmụ ya ebere m, nʼihi na ha bụ ụmụ a kwatara nʼiko. 5Nʼihi na nne ha bụ onye na-akwa iko, ọ tụrụ ime ha nʼọnọdụ ihere. Site nʼikwu sị, ‘Aghaghị m ịgbakwuru ndị enyi nwoke hụrụ m nʼanya, ndị na-enye m nri na mmiri, ajị anụ m na akwa ọcha m, mmanụ oliv m na ihe ọṅụṅụ m.’ 6Nʼihi nke a, aga m eji ogwu na uke gbachie ya gburugburu; aga m agbachi ụzọ ya, mee ya ka ọ ghara ịma ebe ọ na-eje. 7Ọ ga-agbaso ndị ahụ hụrụ ya nʼanya ma ọ gaghị achụkwute ha. Ọ ga-achọ ha ma ọ gaghị ahụ ha. Mgbe ahụ, ọ ga-asị, ‘Ka m gaa laghachikwuru di mbụ m, nʼihi na ọ dịrị m mma mgbe ahụ karịa ugbu a.’

Igbo text and audio: Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™, made available under an open license by Biblica, Inc.