Hosiya 2:3
Hosea 2:3 · Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020
Ma ọ bụghị otu a, aga m eyipụ ya uwe ya mee ka ọ gbara ọtọ, aga m eme ka o gbara ọtọ dị ka nʼụbọchị ahụ a mụrụ ya. Aga m eme ya ka ọ dị ka ọzara, ka ọ ghọọ nʼala kpọrọ nkụ, were akpịrị ịkpọ nkụ mee ka ọ nwụọ.
Hosea 2:3 in English
Hosea 2:3 · Berean Standard Bible
Otherwise, I will strip her naked and expose her like the day of her birth. I will make her like a desert and turn her into a parched land, and I will let her die of thirst.
Context
1“Gwa ụmụnne gị ndị nwoke Ami, ‘nke pụtara ndị m,’ gwakwa ụmụnne gị nwanyị Ruhama, nke pụtara, ‘Unu ndị m hụrụ nʼanya.’ 2“Unu guzogidenụ nne unu, rịọọnụ ya,
nʼihi na ọ bụghị nwunye m,
mụ onwe m abụkwaghị di ya.
Gwanụ ya ka o wezuga ịkwa iko site nʼihu ya,
ya wezugakwa ịgba akwụna nke dị nʼetiti ara ya abụọ. 3Ma ọ bụghị otu a, aga m eyipụ ya uwe ya mee ka ọ gbara ọtọ,
aga m eme ka o gbara ọtọ dị ka nʼụbọchị ahụ a mụrụ ya.
Aga m eme ya ka ọ dị ka ọzara,
ka ọ ghọọ nʼala kpọrọ nkụ,
were akpịrị ịkpọ nkụ mee ka ọ nwụọ. 4Agaghị m egosi ụmụ ya ebere m,
nʼihi na ha bụ ụmụ a kwatara nʼiko. 5Nʼihi na nne ha bụ onye na-akwa iko,
ọ tụrụ ime ha nʼọnọdụ ihere.
Site nʼikwu sị, ‘Aghaghị m ịgbakwuru ndị enyi nwoke hụrụ m nʼanya,
ndị na-enye m nri na mmiri,
ajị anụ m na akwa ọcha m, mmanụ oliv m na ihe ọṅụṅụ m.’
Igbo text and audio: Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™, made available under an open license by Biblica, Inc.