Native Bible

Hosea 2:2 · Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020

“Unu guzogidenụ nne unu, rịọọnụ ya, nʼihi na ọ bụghị nwunye m, mụ onwe m abụkwaghị di ya. Gwanụ ya ka o wezuga ịkwa iko site nʼihu ya, ya wezugakwa ịgba akwụna nke dị nʼetiti ara ya abụọ.

Hosea 2:2 in English

Hosea 2:2 · Berean Standard Bible

Rebuke your mother, rebuke her, for she is not My wife, and I am not her husband. Let her remove the adultery from her face and the unfaithfulness from between her breasts.

Context

1“Gwa ụmụnne gị ndị nwoke Ami, ‘nke pụtara ndị m,’ gwakwa ụmụnne gị nwanyị Ruhama, nke pụtara, ‘Unu ndị m hụrụ nʼanya.’ 2“Unu guzogidenụ nne unu, rịọọnụ ya, nʼihi na ọ bụghị nwunye m, mụ onwe m abụkwaghị di ya. Gwanụ ya ka o wezuga ịkwa iko site nʼihu ya, ya wezugakwa ịgba akwụna nke dị nʼetiti ara ya abụọ. 3Ma ọ bụghị otu a, aga m eyipụ ya uwe ya mee ka ọ gbara ọtọ, aga m eme ka o gbara ọtọ dị ka nʼụbọchị ahụ a mụrụ ya. Aga m eme ya ka ọ dị ka ọzara, ka ọ ghọọ nʼala kpọrọ nkụ, were akpịrị ịkpọ nkụ mee ka ọ nwụọ. 4Agaghị m egosi ụmụ ya ebere m, nʼihi na ha bụ ụmụ a kwatara nʼiko.

Igbo text and audio: Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™, made available under an open license by Biblica, Inc.