Hosiya 2:21
Hosea 2:21 · Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020
“Nʼụbọchị ahụ m ga-azaghachi,” otu a ka Onyenwe anyị kwubiri ya. “M ga-azaghachi eluigwe, ha ga-azaghachi ala.
Hosea 2:21 in English
Hosea 2:21 · Berean Standard Bible
“On that day I will respond—” declares the LORD— “I will respond to the heavens, and they will respond to the earth.
Context
19Aga m ekwerekwa ịlụ gị dịka nwunye ruo ebighị ebi;
aga m ekwerekwa ịlụ gị nʼezi omume na ikpe ziri ezi,
nʼịhụnanya nke na-adịgide, nakwa obi ebere. 20Aga m eji ikwesi ntụkwasị obi kwere ịlụ gị.
Ị ga-amatakwa Onyenwe anyị. 21“Nʼụbọchị ahụ m ga-azaghachi,”
otu a ka Onyenwe anyị kwubiri ya.
“M ga-azaghachi eluigwe,
ha ga-azaghachi ala. 22Ala ga-azaghachi ọka
na mmanya ọhụrụ na mmanụ oliv,
mgbe ahụ ha ga-azaghachi Jezril. 23Aga m akụkwa ya nye onwe m nʼala ahụ dịka mkpụrụ.
Aga m egosi ịhụnanya m nʼahụ onye ahụ m kpọrọ, ‘Onye m na-ahụghị nʼanya.’*
M ga-asịkwa ndị ahụ a kpọrọ, ‘Ndị na-abụghị ndị m,*’ ‘Unu bụ ndị nke m,’
Ha ga-azakwa, ‘Chineke m ka ị bụ.’ ”
2:10 Ndị ya na ha na-akwa iko
2:16 Maọbụ, Baal nʼasụsụ Hibru
2:23 Enwekwa obi ebere nʼahụ Lo-Ruhama,
2:23 Ya bụ, Lo-ammi,
Igbo text and audio: Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™, made available under an open license by Biblica, Inc.