Hosiya 2:19
Hosea 2:19 · Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020
Aga m ekwerekwa ịlụ gị dịka nwunye ruo ebighị ebi; aga m ekwerekwa ịlụ gị nʼezi omume na ikpe ziri ezi, nʼịhụnanya nke na-adịgide, nakwa obi ebere.
Hosea 2:19 in English
Hosea 2:19 · Berean Standard Bible
So I will betroth you to Me forever; I will betroth you in righteousness and justice, in loving devotion * and compassion.
Context
17Nʼihi na aga m ewepụkwa aha niile nke arụsị Baal nʼegbugbere ọnụ ya,
ha gaghị akpọkwa ha aha ọzọ. 18Nʼụbọchị ahụ, aga m eme ka gị na ụmụ anụ ọhịa gbaa ndụ,
meekwa ka gị na ụmụ nnụnụ,
na ihe niile e kere eke nʼakpụgharị nʼala gbaa ndụ.
Aga m emebi ngwa agha niile,
agha niile ga-akwụsịkwa.
Mgbe ahụ, a ga-eme ka ị dịnaa ala nʼudo na-enweghị nsogbu, na ụjọ. 19Aga m ekwerekwa ịlụ gị dịka nwunye ruo ebighị ebi;
aga m ekwerekwa ịlụ gị nʼezi omume na ikpe ziri ezi,
nʼịhụnanya nke na-adịgide, nakwa obi ebere. 20Aga m eji ikwesi ntụkwasị obi kwere ịlụ gị.
Ị ga-amatakwa Onyenwe anyị. 21“Nʼụbọchị ahụ m ga-azaghachi,”
otu a ka Onyenwe anyị kwubiri ya.
“M ga-azaghachi eluigwe,
ha ga-azaghachi ala.
Igbo text and audio: Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™, made available under an open license by Biblica, Inc.