Hosiya 2:18
Hosea 2:18 · Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020
Nʼụbọchị ahụ, aga m eme ka gị na ụmụ anụ ọhịa gbaa ndụ, meekwa ka gị na ụmụ nnụnụ, na ihe niile e kere eke nʼakpụgharị nʼala gbaa ndụ. Aga m emebi ngwa agha niile, agha niile ga-akwụsịkwa. Mgbe ahụ, a ga-eme ka ị dịnaa ala nʼudo na-enweghị nsogbu, na ụjọ.
Hosea 2:18 in English
Hosea 2:18 · Berean Standard Bible
On that day I will make a covenant for them with the beasts of the field and the birds of the air and the creatures that crawl on the ground. And I will abolish bow and sword and weapons of war in the land, and will make them lie down in safety.
Context
16“Nʼụbọchị ahụ,” otu a ka Onyenwe anyị kwubiri,
“Ị ga-akpọ m ‘Di m,’
ị gaghị akpọkwa m ‘nna m ukwu,’ ọzọ.* 17Nʼihi na aga m ewepụkwa aha niile nke arụsị Baal nʼegbugbere ọnụ ya,
ha gaghị akpọkwa ha aha ọzọ. 18Nʼụbọchị ahụ, aga m eme ka gị na ụmụ anụ ọhịa gbaa ndụ,
meekwa ka gị na ụmụ nnụnụ,
na ihe niile e kere eke nʼakpụgharị nʼala gbaa ndụ.
Aga m emebi ngwa agha niile,
agha niile ga-akwụsịkwa.
Mgbe ahụ, a ga-eme ka ị dịnaa ala nʼudo na-enweghị nsogbu, na ụjọ. 19Aga m ekwerekwa ịlụ gị dịka nwunye ruo ebighị ebi;
aga m ekwerekwa ịlụ gị nʼezi omume na ikpe ziri ezi,
nʼịhụnanya nke na-adịgide, nakwa obi ebere. 20Aga m eji ikwesi ntụkwasị obi kwere ịlụ gị.
Ị ga-amatakwa Onyenwe anyị.
Igbo text and audio: Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™, made available under an open license by Biblica, Inc.