Native Bible

Hosea 2:16 · Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020

“Nʼụbọchị ahụ,” otu a ka Onyenwe anyị kwubiri, “Ị ga-akpọ m ‘Di m,’ ị gaghị akpọkwa m ‘nna m ukwu,’ ọzọ.*

Hosea 2:16 in English

Hosea 2:16 · Berean Standard Bible

In that day,” declares the LORD, “you will call Me ‘my Husband,’* and no longer call Me ‘my Master.’*

Context

14“Nʼihi nke a, aga m arara ya, duba ya nʼime ọzara, jiri olu dị nro gwa ya okwu nʼebe ahụ. 15Ebe ahụ ka m ga-enyeghachi ya ubi vaịnị ya, gbanweekwa Ndagwurugwu Akọ, mee ka ọ ghọọ ọnụ ụzọ olileanya. Mgbe ahụ, ọ ga-azakwa m dịka o mere mgbe ọ bụ agbọghọbịa, nʼoge ahụ o si nʼala Ijipt pụta. 16“Nʼụbọchị ahụ,” otu a ka Onyenwe anyị kwubiri, “Ị ga-akpọ m ‘Di m,’ ị gaghị akpọkwa m ‘nna m ukwu,’ ọzọ.* 17Nʼihi na aga m ewepụkwa aha niile nke arụsị Baal nʼegbugbere ọnụ ya, ha gaghị akpọkwa ha aha ọzọ. 18Nʼụbọchị ahụ, aga m eme ka gị na ụmụ anụ ọhịa gbaa ndụ, meekwa ka gị na ụmụ nnụnụ, na ihe niile e kere eke nʼakpụgharị nʼala gbaa ndụ. Aga m emebi ngwa agha niile, agha niile ga-akwụsịkwa. Mgbe ahụ, a ga-eme ka ị dịnaa ala nʼudo na-enweghị nsogbu, na ụjọ.

Igbo text and audio: Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™, made available under an open license by Biblica, Inc.