Hosiya 2:14
Hosea 2:14 · Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020
“Nʼihi nke a, aga m arara ya, duba ya nʼime ọzara, jiri olu dị nro gwa ya okwu nʼebe ahụ.
Hosea 2:14 in English
Hosea 2:14 · Berean Standard Bible
“Therefore, behold, I will allure her and lead her to the wilderness, and speak to her tenderly.
Context
12Aga m ala ubi vaịnị ya na osisi fiig ya niile nʼiyi,
nke ọ sịrị bụ ụgwọ ọrụ ya site nʼaka ndị hụrụ ya nʼanya;
aga m emekwa ka ha ghọọ oke ọhịa,
anụ ọhịa ga-eripịa ha. 13Aga m enye ya ahụhụ maka ụbọchị niile
bụ nke o surere ihe na-esi isi ụtọ nye chi Baal niile,
ọ chịrị mgbaaka mkpịsịaka na ihe ịchọ mma niile, jikere onwe ya,
pụọ chụso ndị ahụ hụrụ ya nʼanya,
ma chezọọ m,” Otu a ka Onyenwe anyị kwubiri ya. 14“Nʼihi nke a, aga m arara ya,
duba ya nʼime ọzara,
jiri olu dị nro gwa ya okwu nʼebe ahụ. 15Ebe ahụ ka m ga-enyeghachi ya ubi vaịnị ya,
gbanweekwa Ndagwurugwu Akọ, mee ka ọ ghọọ ọnụ ụzọ olileanya.
Mgbe ahụ, ọ ga-azakwa m dịka o mere mgbe ọ bụ agbọghọbịa,
nʼoge ahụ o si nʼala Ijipt pụta. 16“Nʼụbọchị ahụ,” otu a ka Onyenwe anyị kwubiri,
“Ị ga-akpọ m ‘Di m,’
ị gaghị akpọkwa m ‘nna m ukwu,’ ọzọ.*
Igbo text and audio: Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™, made available under an open license by Biblica, Inc.