Hosiya 13:5
Hosea 13:5 · Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020
Elekọtara m unu nʼime ọzara, nʼala ahụ kpọrọ nkụ, nke mmiri na-adịghị.
Hosea 13:5 in English
Hosea 13:5 · Berean Standard Bible
I knew you in the wilderness, in the land of drought.
Context
3Nʼihi ya, ha ga-adị ka igirigi nke ụtụtụ,
maọbụ igirigi nke na-agbachapụ ngwangwa,
dịka igbugbo nke a fụchapụrụ nʼebe ịzọcha ọka,
dịka anwụrụ ọkụ nke si na oghereikuku na-ekupụ. 4“Ma mụ onwe m bụ Onyenwe anyị na Chineke gị,
siterịị nʼala Ijipt.
Unu agaghị anabatara onwe unu Chineke ọzọ karịa m.
Ọ dịghị Onye nzọpụta ọzọ dị karịa m. 5Elekọtara m unu nʼime ọzara,
nʼala ahụ kpọrọ nkụ, nke mmiri na-adịghị. 6Mgbe m nyere ha nri, ha rijukwara afọ.
Mgbe afọ juru ha, ha bidoro ịkpa nganga,
chefuo m. 7Nʼihi ya, aghaghị m ịbịakwasị ha dịka ọdụm;
maọbụ dịka agụ nke na-ezo onwe ya nʼakụkụ ụzọ.
Igbo text and audio: Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™, made available under an open license by Biblica, Inc.