Hosiya 13:3
Hosea 13:3 · Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020
Nʼihi ya, ha ga-adị ka igirigi nke ụtụtụ, maọbụ igirigi nke na-agbachapụ ngwangwa, dịka igbugbo nke a fụchapụrụ nʼebe ịzọcha ọka, dịka anwụrụ ọkụ nke si na oghereikuku na-ekupụ.
Hosea 13:3 in English
Hosea 13:3 · Berean Standard Bible
Therefore they will be like the morning mist, like the early dew that vanishes, like chaff blown from a threshing floor, like smoke through an open window.
Context
1Na mbụ, mgbe ọbụla Ifrem kwuru okwu, a na-enwe ọma jijiji,
nʼihi na ọ bụ onye e buliri elu nʼIzrel.
Ma ikpe maara ya nʼihi ofufe o fere Baal, ọ nwụkwara. 2Ugbu a, ha na-aga nʼihu nʼime mmehie,
ha na-eji ọlaọcha na-akpụrụ onwe ha arụsị dị iche iche,
nke ha ji uche kpachara anya kpụzie nke ọma,
ha niile bụ akaọrụ ndị ǹka.
Ha onwe ha na-ekwu,
“Ha na-achụ aja ụmụ mmadụ.
Ha na-esusukwa nwa ehi a kpụrụ akpụ ọnụ” 3Nʼihi ya, ha ga-adị ka igirigi nke ụtụtụ,
maọbụ igirigi nke na-agbachapụ ngwangwa,
dịka igbugbo nke a fụchapụrụ nʼebe ịzọcha ọka,
dịka anwụrụ ọkụ nke si na oghereikuku na-ekupụ. 4“Ma mụ onwe m bụ Onyenwe anyị na Chineke gị,
siterịị nʼala Ijipt.
Unu agaghị anabatara onwe unu Chineke ọzọ karịa m.
Ọ dịghị Onye nzọpụta ọzọ dị karịa m. 5Elekọtara m unu nʼime ọzara,
nʼala ahụ kpọrọ nkụ, nke mmiri na-adịghị.
Igbo text and audio: Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™, made available under an open license by Biblica, Inc.