Native Bible

Hosea 13:2 · Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020

Ugbu a, ha na-aga nʼihu nʼime mmehie, ha na-eji ọlaọcha na-akpụrụ onwe ha arụsị dị iche iche, nke ha ji uche kpachara anya kpụzie nke ọma, ha niile bụ akaọrụ ndị ǹka. Ha onwe ha na-ekwu, “Ha na-achụ aja ụmụ mmadụ. Ha na-esusukwa nwa ehi a kpụrụ akpụ ọnụ”

Hosea 13:2 in English

Hosea 13:2 · Berean Standard Bible

Now they sin more and more and make for themselves cast images, idols skillfully made from their silver, all of them the work of craftsmen. People say of them, “They offer human sacrifice and kiss the calves!”*

Context

1Na mbụ, mgbe ọbụla Ifrem kwuru okwu, a na-enwe ọma jijiji, nʼihi na ọ bụ onye e buliri elu nʼIzrel. Ma ikpe maara ya nʼihi ofufe o fere Baal, ọ nwụkwara. 2Ugbu a, ha na-aga nʼihu nʼime mmehie, ha na-eji ọlaọcha na-akpụrụ onwe ha arụsị dị iche iche, nke ha ji uche kpachara anya kpụzie nke ọma, ha niile bụ akaọrụ ndị ǹka. Ha onwe ha na-ekwu, “Ha na-achụ aja ụmụ mmadụ. Ha na-esusukwa nwa ehi a kpụrụ akpụ ọnụ” 3Nʼihi ya, ha ga-adị ka igirigi nke ụtụtụ, maọbụ igirigi nke na-agbachapụ ngwangwa, dịka igbugbo nke a fụchapụrụ nʼebe ịzọcha ọka, dịka anwụrụ ọkụ nke si na oghereikuku na-ekupụ. 4“Ma mụ onwe m bụ Onyenwe anyị na Chineke gị, siterịị nʼala Ijipt. Unu agaghị anabatara onwe unu Chineke ọzọ karịa m. Ọ dịghị Onye nzọpụta ọzọ dị karịa m.

Igbo text and audio: Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™, made available under an open license by Biblica, Inc.