Hosiya 13:4
Hosea 13:4 · Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020
“Ma mụ onwe m bụ Onyenwe anyị na Chineke gị, siterịị nʼala Ijipt. Unu agaghị anabatara onwe unu Chineke ọzọ karịa m. Ọ dịghị Onye nzọpụta ọzọ dị karịa m.
Hosea 13:4 in English
Hosea 13:4 · Berean Standard Bible
Yet I am the LORD your God ever since the land of Egypt; you know no God but Me, for there is no Savior besides Me.
Context
2Ugbu a, ha na-aga nʼihu nʼime mmehie,
ha na-eji ọlaọcha na-akpụrụ onwe ha arụsị dị iche iche,
nke ha ji uche kpachara anya kpụzie nke ọma,
ha niile bụ akaọrụ ndị ǹka.
Ha onwe ha na-ekwu,
“Ha na-achụ aja ụmụ mmadụ.
Ha na-esusukwa nwa ehi a kpụrụ akpụ ọnụ” 3Nʼihi ya, ha ga-adị ka igirigi nke ụtụtụ,
maọbụ igirigi nke na-agbachapụ ngwangwa,
dịka igbugbo nke a fụchapụrụ nʼebe ịzọcha ọka,
dịka anwụrụ ọkụ nke si na oghereikuku na-ekupụ. 4“Ma mụ onwe m bụ Onyenwe anyị na Chineke gị,
siterịị nʼala Ijipt.
Unu agaghị anabatara onwe unu Chineke ọzọ karịa m.
Ọ dịghị Onye nzọpụta ọzọ dị karịa m. 5Elekọtara m unu nʼime ọzara,
nʼala ahụ kpọrọ nkụ, nke mmiri na-adịghị. 6Mgbe m nyere ha nri, ha rijukwara afọ.
Mgbe afọ juru ha, ha bidoro ịkpa nganga,
chefuo m.
Igbo text and audio: Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™, made available under an open license by Biblica, Inc.