Native Bible

Hosea 13:4 · Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020

“Ma mụ onwe m bụ Onyenwe anyị na Chineke gị, siterịị nʼala Ijipt. Unu agaghị anabatara onwe unu Chineke ọzọ karịa m. Ọ dịghị Onye nzọpụta ọzọ dị karịa m.

Hosea 13:4 in English

Hosea 13:4 · Berean Standard Bible

Yet I am the LORD your God ever since the land of Egypt; you know no God but Me, for there is no Savior besides Me.

Context

2Ugbu a, ha na-aga nʼihu nʼime mmehie, ha na-eji ọlaọcha na-akpụrụ onwe ha arụsị dị iche iche, nke ha ji uche kpachara anya kpụzie nke ọma, ha niile bụ akaọrụ ndị ǹka. Ha onwe ha na-ekwu, “Ha na-achụ aja ụmụ mmadụ. Ha na-esusukwa nwa ehi a kpụrụ akpụ ọnụ” 3Nʼihi ya, ha ga-adị ka igirigi nke ụtụtụ, maọbụ igirigi nke na-agbachapụ ngwangwa, dịka igbugbo nke a fụchapụrụ nʼebe ịzọcha ọka, dịka anwụrụ ọkụ nke si na oghereikuku na-ekupụ. 4“Ma mụ onwe m bụ Onyenwe anyị na Chineke gị, siterịị nʼala Ijipt. Unu agaghị anabatara onwe unu Chineke ọzọ karịa m. Ọ dịghị Onye nzọpụta ọzọ dị karịa m. 5Elekọtara m unu nʼime ọzara, nʼala ahụ kpọrọ nkụ, nke mmiri na-adịghị. 6Mgbe m nyere ha nri, ha rijukwara afọ. Mgbe afọ juru ha, ha bidoro ịkpa nganga, chefuo m.

Igbo text and audio: Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™, made available under an open license by Biblica, Inc.