Native Bible

Hosea 13:7 · Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020

Nʼihi ya, aghaghị m ịbịakwasị ha dịka ọdụm; maọbụ dịka agụ nke na-ezo onwe ya nʼakụkụ ụzọ.

Hosea 13:7 in English

Hosea 13:7 · Berean Standard Bible

So like a lion I will pounce on them; like a leopard I will lurk by the path.

Context

5Elekọtara m unu nʼime ọzara, nʼala ahụ kpọrọ nkụ, nke mmiri na-adịghị. 6Mgbe m nyere ha nri, ha rijukwara afọ. Mgbe afọ juru ha, ha bidoro ịkpa nganga, chefuo m. 7Nʼihi ya, aghaghị m ịbịakwasị ha dịka ọdụm; maọbụ dịka agụ nke na-ezo onwe ya nʼakụkụ ụzọ. 8Aga m adakwasị ha dịka anụ ọhịa bịa nke a gbabara aka ụmụ ya, dọwasịa anụ ahụ kpuchiri obi ha aga m eripịa ha dịka ọdụm, anụ ọhịa ga-adọkasịkwa ha. 9“Aga m ala gị nʼiyi, gị Izrel, onye pụrụ inyere gị aka?

Igbo text and audio: Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™, made available under an open license by Biblica, Inc.