Native Bible

Habakkuk 3:11 · Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020

Anyanwụ na ọnwa guzokwara duu na mbara eluigwe, mgbe ha hụrụ ihe nke àkụ gị, mgbe ha hụrụ amụma nke ùbe gị gburu.

Habakkuk 3:11 in English

Habakkuk 3:11 · Berean Standard Bible

Sun and moon stood still in their places at the flash of Your flying arrows, at the brightness of Your shining spear.

Context

9I kpughepụrụ ụta gị, kpọọ oku ka a chịtara gị ọtụtụ àkụ. Sela I ji osimiri dị iche iche kewaa ụwa. 10Mgbe ugwu niile hụrụ gị ha nyagharịrị onwe ha nʼihi ihe mgbu bịakwasịrị ha. Oke mmiri ozuzo gabigakwara. Ogbu mmiri mere ka olu ya daa ụda, buliekwa ebili mmiri elu. 11Anyanwụ na ọnwa guzokwara duu na mbara eluigwe, mgbe ha hụrụ ihe nke àkụ gị, mgbe ha hụrụ amụma nke ùbe gị gburu. 12I sitere nʼọnụma gị zọgharịa ije nʼụwa, sitekwa nʼiwe gị zọchaa mba dị iche iche dịka ọka. 13Ị pụtara ịzọpụta ndị gị, ịzọpụta onye ahụ i tere mmanụ. Ị zọpịara isi onyendu nke ala ajọ omume ahụ, gbawa ya ọtọ site nʼisi ruo nʼụkwụ.

Igbo text and audio: Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™, made available under an open license by Biblica, Inc.