Habakuk 3:12
Habakkuk 3:12 · Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020
I sitere nʼọnụma gị zọgharịa ije nʼụwa, sitekwa nʼiwe gị zọchaa mba dị iche iche dịka ọka.
Habakkuk 3:12 in English
Habakkuk 3:12 · Berean Standard Bible
You marched across the earth with fury; You threshed the nations in wrath.
Context
10Mgbe ugwu niile hụrụ gị ha nyagharịrị onwe ha nʼihi ihe mgbu bịakwasịrị ha.
Oke mmiri ozuzo gabigakwara.
Ogbu mmiri mere ka olu ya daa ụda,
buliekwa ebili mmiri elu. 11Anyanwụ na ọnwa guzokwara duu na mbara eluigwe,
mgbe ha hụrụ ihe nke àkụ gị,
mgbe ha hụrụ amụma nke ùbe gị gburu. 12I sitere nʼọnụma gị zọgharịa ije nʼụwa,
sitekwa nʼiwe gị zọchaa mba dị iche iche dịka ọka. 13Ị pụtara ịzọpụta ndị gị,
ịzọpụta onye ahụ i tere mmanụ.
Ị zọpịara isi onyendu nke ala ajọ omume ahụ,
gbawa ya ọtọ site nʼisi ruo nʼụkwụ. 14Ọ bụ ùbe ya ka i ji mawaa ya isi,
mgbe ndị dike nʼagha ya bịara dịka oke ifufe ịchụsa anyị,
mgbe ha si nʼobi ụtọ ha chee na ha na-aga iripịa ndị ogbenye e wedara nʼala,
bụ ndị na-ezo onwe ha.
Igbo text and audio: Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™, made available under an open license by Biblica, Inc.