Habakuk 3:10
Habakkuk 3:10 · Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020
Mgbe ugwu niile hụrụ gị ha nyagharịrị onwe ha nʼihi ihe mgbu bịakwasịrị ha. Oke mmiri ozuzo gabigakwara. Ogbu mmiri mere ka olu ya daa ụda, buliekwa ebili mmiri elu.
Habakkuk 3:10 in English
Habakkuk 3:10 · Berean Standard Bible
The mountains saw You and quaked; torrents of water swept by. The deep roared with its voice and lifted its hands on high.
Context
8Ọ bụ osimiri, ka gị bụ Onyenwe anyị were iwe megide?
Ọnụma gị, ọ dị ukwuu megide iyi niile?
Oke iwe gị ọ bụ megide oke osimiri
mgbe ị nọkwasịrị nʼelu ịnyịnya gị,
nakwa nʼelu ụgbọ ịnyịnya ị wetara ndị nke gị mmeri? 9I kpughepụrụ ụta gị,
kpọọ oku ka a chịtara gị ọtụtụ àkụ. Sela
I ji osimiri dị iche iche kewaa ụwa. 10Mgbe ugwu niile hụrụ gị ha nyagharịrị onwe ha nʼihi ihe mgbu bịakwasịrị ha.
Oke mmiri ozuzo gabigakwara.
Ogbu mmiri mere ka olu ya daa ụda,
buliekwa ebili mmiri elu. 11Anyanwụ na ọnwa guzokwara duu na mbara eluigwe,
mgbe ha hụrụ ihe nke àkụ gị,
mgbe ha hụrụ amụma nke ùbe gị gburu. 12I sitere nʼọnụma gị zọgharịa ije nʼụwa,
sitekwa nʼiwe gị zọchaa mba dị iche iche dịka ọka.
Igbo text and audio: Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™, made available under an open license by Biblica, Inc.