Habakuk 3:9
Habakkuk 3:9 · Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020
I kpughepụrụ ụta gị, kpọọ oku ka a chịtara gị ọtụtụ àkụ. Sela I ji osimiri dị iche iche kewaa ụwa.
Habakkuk 3:9 in English
Habakkuk 3:9 · Berean Standard Bible
You brandished Your bow; You called for many arrows. Selah You split the earth with rivers.
Context
7Ahụrụ m ụlọ ikwu nke Kushan ka ha nọ ọnọdụ ụbọchị ọjọọ,
na ebe obibi ndị Midia ka ha nọ na oke ahụ ụfụ. 8Ọ bụ osimiri, ka gị bụ Onyenwe anyị were iwe megide?
Ọnụma gị, ọ dị ukwuu megide iyi niile?
Oke iwe gị ọ bụ megide oke osimiri
mgbe ị nọkwasịrị nʼelu ịnyịnya gị,
nakwa nʼelu ụgbọ ịnyịnya ị wetara ndị nke gị mmeri? 9I kpughepụrụ ụta gị,
kpọọ oku ka a chịtara gị ọtụtụ àkụ. Sela
I ji osimiri dị iche iche kewaa ụwa. 10Mgbe ugwu niile hụrụ gị ha nyagharịrị onwe ha nʼihi ihe mgbu bịakwasịrị ha.
Oke mmiri ozuzo gabigakwara.
Ogbu mmiri mere ka olu ya daa ụda,
buliekwa ebili mmiri elu. 11Anyanwụ na ọnwa guzokwara duu na mbara eluigwe,
mgbe ha hụrụ ihe nke àkụ gị,
mgbe ha hụrụ amụma nke ùbe gị gburu.
Igbo text and audio: Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™, made available under an open license by Biblica, Inc.