Native Bible

Habakkuk 3:7 · Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020

Ahụrụ m ụlọ ikwu nke Kushan ka ha nọ ọnọdụ ụbọchị ọjọọ, na ebe obibi ndị Midia ka ha nọ na oke ahụ ụfụ.

Habakkuk 3:7 in English

Habakkuk 3:7 · Berean Standard Bible

I saw the tents of Cushan in distress; the curtains of Midian were trembling.

Context

5Nʼihu ya ka ajọ ọrịa na-efe efe na-aga, oke mbibi na-esokwa ya nʼazụ. 6O guzoro ọtọ yọgharịa ụwa; o lere anya, mee ka mba niile maa jijiji. Ugwu ukwu ochie ahụ niile dara, ugwu nta ochie ndị ahụ dakwara. Nʼihi na ụzọ ya ga-adịgide ruo mgbe niile ebighị ebi. 7Ahụrụ m ụlọ ikwu nke Kushan ka ha nọ ọnọdụ ụbọchị ọjọọ, na ebe obibi ndị Midia ka ha nọ na oke ahụ ụfụ. 8Ọ bụ osimiri, ka gị bụ Onyenwe anyị were iwe megide? Ọnụma gị, ọ dị ukwuu megide iyi niile? Oke iwe gị ọ bụ megide oke osimiri mgbe ị nọkwasịrị nʼelu ịnyịnya gị, nakwa nʼelu ụgbọ ịnyịnya ị wetara ndị nke gị mmeri? 9I kpughepụrụ ụta gị, kpọọ oku ka a chịtara gị ọtụtụ àkụ. Sela I ji osimiri dị iche iche kewaa ụwa.

Igbo text and audio: Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™, made available under an open license by Biblica, Inc.