Habakuk 3:5
Habakkuk 3:5 · Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020
Nʼihu ya ka ajọ ọrịa na-efe efe na-aga, oke mbibi na-esokwa ya nʼazụ.
Habakkuk 3:5 in English
Habakkuk 3:5 · Berean Standard Bible
Plague went before Him, and fever followed in His steps.
Context
3Chineke si na Teman bịa,
Onye Nsọ ahụ sikwa nʼugwu Paran. Sela
Ebube ya na-ekpuchi eluigwe,
otuto ya jupụtakwara nʼụwa. 4Ịma mma ya na-achapụta dịka ihe anyanwụ ụtụtụ,
ihe na-enwupụta site nʼaka ya,
ọ bụkwa nʼebe ahụ ka e zoro ike ya. 5Nʼihu ya ka ajọ ọrịa na-efe efe na-aga,
oke mbibi na-esokwa ya nʼazụ. 6O guzoro ọtọ yọgharịa ụwa;
o lere anya, mee ka mba niile maa jijiji.
Ugwu ukwu ochie ahụ niile dara,
ugwu nta ochie ndị ahụ dakwara.
Nʼihi na ụzọ ya ga-adịgide ruo mgbe niile ebighị ebi. 7Ahụrụ m ụlọ ikwu nke Kushan ka ha nọ ọnọdụ ụbọchị ọjọọ,
na ebe obibi ndị Midia ka ha nọ na oke ahụ ụfụ.
Igbo text and audio: Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™, made available under an open license by Biblica, Inc.