Habakuk 3:6
Habakkuk 3:6 · Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020
O guzoro ọtọ yọgharịa ụwa; o lere anya, mee ka mba niile maa jijiji. Ugwu ukwu ochie ahụ niile dara, ugwu nta ochie ndị ahụ dakwara. Nʼihi na ụzọ ya ga-adịgide ruo mgbe niile ebighị ebi.
Habakkuk 3:6 in English
Habakkuk 3:6 · Berean Standard Bible
He stood and measured the earth; He looked and startled the nations; the ancient mountains crumbled; the perpetual hills collapsed. His ways are everlasting.
Context
4Ịma mma ya na-achapụta dịka ihe anyanwụ ụtụtụ,
ihe na-enwupụta site nʼaka ya,
ọ bụkwa nʼebe ahụ ka e zoro ike ya. 5Nʼihu ya ka ajọ ọrịa na-efe efe na-aga,
oke mbibi na-esokwa ya nʼazụ. 6O guzoro ọtọ yọgharịa ụwa;
o lere anya, mee ka mba niile maa jijiji.
Ugwu ukwu ochie ahụ niile dara,
ugwu nta ochie ndị ahụ dakwara.
Nʼihi na ụzọ ya ga-adịgide ruo mgbe niile ebighị ebi. 7Ahụrụ m ụlọ ikwu nke Kushan ka ha nọ ọnọdụ ụbọchị ọjọọ,
na ebe obibi ndị Midia ka ha nọ na oke ahụ ụfụ. 8Ọ bụ osimiri, ka gị bụ Onyenwe anyị were iwe megide?
Ọnụma gị, ọ dị ukwuu megide iyi niile?
Oke iwe gị ọ bụ megide oke osimiri
mgbe ị nọkwasịrị nʼelu ịnyịnya gị,
nakwa nʼelu ụgbọ ịnyịnya ị wetara ndị nke gị mmeri?
Igbo text and audio: Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™, made available under an open license by Biblica, Inc.