Habakuk 3:4
Habakkuk 3:4 · Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020
Ịma mma ya na-achapụta dịka ihe anyanwụ ụtụtụ, ihe na-enwupụta site nʼaka ya, ọ bụkwa nʼebe ahụ ka e zoro ike ya.
Habakkuk 3:4 in English
Habakkuk 3:4 · Berean Standard Bible
His radiance was like the sunlight; rays flashed from His hand, where His power is hidden.
Context
2Onyenwe anyị anụla m ihe niile e kwuru banyere ude gị.
Ịdị ukwuu nke ọrụ gị niile na-emekwa ka m dere duu nʼegwu nʼihu gị, Onyenwe anyị.
Mekwaa ya ọzọ nʼoge nke anyị,
mekwaa ka anụ akụkọ ya nʼọgbọ anyị.
Nʼoke iwe gị chetakwa ebere. 3Chineke si na Teman bịa,
Onye Nsọ ahụ sikwa nʼugwu Paran. Sela
Ebube ya na-ekpuchi eluigwe,
otuto ya jupụtakwara nʼụwa. 4Ịma mma ya na-achapụta dịka ihe anyanwụ ụtụtụ,
ihe na-enwupụta site nʼaka ya,
ọ bụkwa nʼebe ahụ ka e zoro ike ya. 5Nʼihu ya ka ajọ ọrịa na-efe efe na-aga,
oke mbibi na-esokwa ya nʼazụ. 6O guzoro ọtọ yọgharịa ụwa;
o lere anya, mee ka mba niile maa jijiji.
Ugwu ukwu ochie ahụ niile dara,
ugwu nta ochie ndị ahụ dakwara.
Nʼihi na ụzọ ya ga-adịgide ruo mgbe niile ebighị ebi.
Igbo text and audio: Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™, made available under an open license by Biblica, Inc.