Habakuk 1:5
Habakkuk 1:5 · Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020
“Legide mba niile anya, ka i hụ. Lee, ka o ju gị anya nke ukwuu. Nʼihi na agaje m ime ihe nʼụbọchị ndụ unu, nke unu na-agaghị ekwenye, ọ bụladị ma akọọrọ unu ya.
Habakkuk 1:5 in English
Habakkuk 1:5 · Berean Standard Bible
“Look at the nations and observe— be utterly astounded!* For I am doing a work in your days that you would never believe even if someone told you.*
Context
3Nʼihi gịnị ka i ji eme m ka m na-ahụ ihe ọjọọ?
Gịnị mere i ji anagide mmegbu?
Mbibi na ihe ike dị nʼihu m,
na ịlụ ọgụ, na esemokwu jupụtakwara ebe niile. 4Nʼihi ya, iwu na-ada mba,
ikpe ziri ezi adịghị agakwa nʼihu.
Ndị ajọ mmadụ na-agba ndị ezi omume gburugburu,
nke mere ka ikpe ziri ezi ghọọ ihe gbagọrọ agbagọ. 5“Legide mba niile anya, ka i hụ.
Lee, ka o ju gị anya nke ukwuu.
Nʼihi na agaje m ime ihe nʼụbọchị ndụ unu,
nke unu na-agaghị ekwenye,
ọ bụladị ma akọọrọ unu ya. 6Nʼihi na lee, agaje m ime ka ndị Kaldịa bilie,
bụ mba ahụ na-adịghị eme ebere, na ndị na-eme ngwangwa.
Ha bụ ndị na-ebu agha na-ejegharị na mba niile,
ndị na-esite nʼaka ike na-enweta ebe obibi nke na-abụghị nke ha. 7Ha bụ mba a na-atụ ụjọ, na ndị dịkwa egwu.
Ha bụ iwu nye onwe ha, ihe ha tụpụtara ka ha na-eme.
Ọ bụ onwe ha ka ha na-ebuli elu.
Igbo text and audio: Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™, made available under an open license by Biblica, Inc.