Native Bible

Habakkuk 1:4 · Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020

Nʼihi ya, iwu na-ada mba, ikpe ziri ezi adịghị agakwa nʼihu. Ndị ajọ mmadụ na-agba ndị ezi omume gburugburu, nke mere ka ikpe ziri ezi ghọọ ihe gbagọrọ agbagọ.

Habakkuk 1:4 in English

Habakkuk 1:4 · Berean Standard Bible

Therefore the law is paralyzed, and justice never goes forth. For the wicked hem in the righteous, so that justice is perverted.

Context

2Onyenwe anyị, ruo ole mgbe ka m ga-anọgide na-eti mkpu ma ị dịghị ege ntị? Ruo ole mgbe ka m ga na-etiku gị na-asị, “Ihe ike, ihe ike!” ma ị dịghị azọpụta? 3Nʼihi gịnị ka i ji eme m ka m na-ahụ ihe ọjọọ? Gịnị mere i ji anagide mmegbu? Mbibi na ihe ike dị nʼihu m, na ịlụ ọgụ, na esemokwu jupụtakwara ebe niile. 4Nʼihi ya, iwu na-ada mba, ikpe ziri ezi adịghị agakwa nʼihu. Ndị ajọ mmadụ na-agba ndị ezi omume gburugburu, nke mere ka ikpe ziri ezi ghọọ ihe gbagọrọ agbagọ. 5“Legide mba niile anya, ka i hụ. Lee, ka o ju gị anya nke ukwuu. Nʼihi na agaje m ime ihe nʼụbọchị ndụ unu, nke unu na-agaghị ekwenye, ọ bụladị ma akọọrọ unu ya. 6Nʼihi na lee, agaje m ime ka ndị Kaldịa bilie, bụ mba ahụ na-adịghị eme ebere, na ndị na-eme ngwangwa. Ha bụ ndị na-ebu agha na-ejegharị na mba niile, ndị na-esite nʼaka ike na-enweta ebe obibi nke na-abụghị nke ha.

Igbo text and audio: Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™, made available under an open license by Biblica, Inc.