Habakuk 1:3
Habakkuk 1:3 · Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020
Nʼihi gịnị ka i ji eme m ka m na-ahụ ihe ọjọọ? Gịnị mere i ji anagide mmegbu? Mbibi na ihe ike dị nʼihu m, na ịlụ ọgụ, na esemokwu jupụtakwara ebe niile.
Habakkuk 1:3 in English
Habakkuk 1:3 · Berean Standard Bible
Why do You make me see iniquity? Why do You tolerate wrongdoing? Destruction and violence are before me. Strife is ongoing, and conflict abounds.
Context
1Nke a bụ ozi Habakuk onye amụma natara. 2Onyenwe anyị, ruo ole mgbe ka m ga-anọgide na-eti mkpu
ma ị dịghị ege ntị?
Ruo ole mgbe ka m ga na-etiku gị na-asị, “Ihe ike, ihe ike!”
ma ị dịghị azọpụta? 3Nʼihi gịnị ka i ji eme m ka m na-ahụ ihe ọjọọ?
Gịnị mere i ji anagide mmegbu?
Mbibi na ihe ike dị nʼihu m,
na ịlụ ọgụ, na esemokwu jupụtakwara ebe niile. 4Nʼihi ya, iwu na-ada mba,
ikpe ziri ezi adịghị agakwa nʼihu.
Ndị ajọ mmadụ na-agba ndị ezi omume gburugburu,
nke mere ka ikpe ziri ezi ghọọ ihe gbagọrọ agbagọ. 5“Legide mba niile anya, ka i hụ.
Lee, ka o ju gị anya nke ukwuu.
Nʼihi na agaje m ime ihe nʼụbọchị ndụ unu,
nke unu na-agaghị ekwenye,
ọ bụladị ma akọọrọ unu ya.
Igbo text and audio: Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™, made available under an open license by Biblica, Inc.