Habakuk 1:6
Habakkuk 1:6 · Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020
Nʼihi na lee, agaje m ime ka ndị Kaldịa bilie, bụ mba ahụ na-adịghị eme ebere, na ndị na-eme ngwangwa. Ha bụ ndị na-ebu agha na-ejegharị na mba niile, ndị na-esite nʼaka ike na-enweta ebe obibi nke na-abụghị nke ha.
Habakkuk 1:6 in English
Habakkuk 1:6 · Berean Standard Bible
For behold, I am raising up the Chaldeans *— that ruthless and impetuous nation which marches through the breadth of the earth to seize dwellings not their own.
Context
4Nʼihi ya, iwu na-ada mba,
ikpe ziri ezi adịghị agakwa nʼihu.
Ndị ajọ mmadụ na-agba ndị ezi omume gburugburu,
nke mere ka ikpe ziri ezi ghọọ ihe gbagọrọ agbagọ. 5“Legide mba niile anya, ka i hụ.
Lee, ka o ju gị anya nke ukwuu.
Nʼihi na agaje m ime ihe nʼụbọchị ndụ unu,
nke unu na-agaghị ekwenye,
ọ bụladị ma akọọrọ unu ya. 6Nʼihi na lee, agaje m ime ka ndị Kaldịa bilie,
bụ mba ahụ na-adịghị eme ebere, na ndị na-eme ngwangwa.
Ha bụ ndị na-ebu agha na-ejegharị na mba niile,
ndị na-esite nʼaka ike na-enweta ebe obibi nke na-abụghị nke ha. 7Ha bụ mba a na-atụ ụjọ, na ndị dịkwa egwu.
Ha bụ iwu nye onwe ha, ihe ha tụpụtara ka ha na-eme.
Ọ bụ onwe ha ka ha na-ebuli elu. 8Ịnyịnya ha nwere ụkwụ nkọ karịa agụ.
Ha na-akpa ike karịa nkịta ọhịa nke na-ejegharị nʼanyasị.
Ndị ịnyịnya agha ha na-awụ ọsọ,
ndị ha na-agba ịnyịnya na-esitekwa ebe dị anya na-abịa.
Dịka ugo nke na-efedata i buru nri ọ ga-eri.
Igbo text and audio: Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™, made available under an open license by Biblica, Inc.