Native Bible

Habakkuk 1:14 · Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020

I meela ndị mmadụ ka ha dịrị ka azụ nke osimiri, e, dịka anụ na-akpụ akpụ nke oke osimiri, nke na-enweghị onye na-achị ha.

Habakkuk 1:14 in English

Habakkuk 1:14 · Berean Standard Bible

You have made men like the fish of the sea, like creeping things that have no ruler.

Context

12Onyenwe anyị, Ọ bụ na ị dịghị site mgbe niile ebighị ebi? Chineke m, na Onye Nsọ m, Ị gaghị anwụ. Gị, Onyenwe anyị, họpụtara ha maka ikpe ikpe. Gị, oke nkume m, emeela ka ha bụrụ ndị ga-enweta ahụhụ. 13Ma anya gị dị ọcha nke ukwuu, na ọ dịghị elekwasị ajọ ihe anya; ị naghị anabatakwa mmegbu. Ma gịnị mere i ji gba ndị aghụghọ nkịtị? Gịnị mere i ji gba nkịtị mgbe ndị ajọ omume na-eloda ndị bụ ndị ezi omume karịa ha? 14I meela ndị mmadụ ka ha dịrị ka azụ nke osimiri, e, dịka anụ na-akpụ akpụ nke oke osimiri, nke na-enweghị onye na-achị ha. 15Onye iro nke ajọ omume juru obi, na-eji nko ya na-egbu ha. Ọ na-ejikwa nko ụgbụ ya na-ejide ha. Ọ na-achịkọta ha nʼụgbụ ya, si otu a na-aṅụrị ọṅụ, ma na-etegharịkwa egwu ọṅụ. 16Nʼihi nke a, ọ na-achụ aja na-esurekwa ihe nsure ọkụ na-esi isi ụtọ nye ụgbụ ya, nʼihi na ọ bụ ụgbụ ya na-eme ka ọ na-ebi ezi ndụ, na-erikwa nri kachasị mma

Igbo text and audio: Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™, made available under an open license by Biblica, Inc.