Habakuk 1:14
Habakkuk 1:14 · Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020
I meela ndị mmadụ ka ha dịrị ka azụ nke osimiri, e, dịka anụ na-akpụ akpụ nke oke osimiri, nke na-enweghị onye na-achị ha.
Habakkuk 1:14 in English
Habakkuk 1:14 · Berean Standard Bible
You have made men like the fish of the sea, like creeping things that have no ruler.
Context
12Onyenwe anyị, Ọ bụ na ị dịghị site mgbe niile ebighị ebi?
Chineke m, na Onye Nsọ m, Ị gaghị anwụ.
Gị, Onyenwe anyị, họpụtara ha maka ikpe ikpe.
Gị, oke nkume m, emeela ka ha bụrụ ndị ga-enweta ahụhụ. 13Ma anya gị dị ọcha nke ukwuu, na ọ dịghị elekwasị ajọ ihe anya;
ị naghị anabatakwa mmegbu.
Ma gịnị mere i ji gba ndị aghụghọ nkịtị?
Gịnị mere i ji gba nkịtị mgbe ndị ajọ omume na-eloda
ndị bụ ndị ezi omume karịa ha? 14I meela ndị mmadụ ka ha dịrị ka azụ nke osimiri,
e, dịka anụ na-akpụ akpụ nke oke osimiri, nke na-enweghị onye na-achị ha. 15Onye iro nke ajọ omume juru obi, na-eji nko ya na-egbu ha.
Ọ na-ejikwa nko ụgbụ ya na-ejide ha.
Ọ na-achịkọta ha nʼụgbụ ya,
si otu a na-aṅụrị ọṅụ, ma na-etegharịkwa egwu ọṅụ. 16Nʼihi nke a, ọ na-achụ aja
na-esurekwa ihe nsure ọkụ na-esi isi ụtọ nye ụgbụ ya,
nʼihi na ọ bụ ụgbụ ya na-eme ka ọ na-ebi ezi ndụ,
na-erikwa nri kachasị mma
Igbo text and audio: Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™, made available under an open license by Biblica, Inc.