Habakuk 1:13
Habakkuk 1:13 · Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020
Ma anya gị dị ọcha nke ukwuu, na ọ dịghị elekwasị ajọ ihe anya; ị naghị anabatakwa mmegbu. Ma gịnị mere i ji gba ndị aghụghọ nkịtị? Gịnị mere i ji gba nkịtị mgbe ndị ajọ omume na-eloda ndị bụ ndị ezi omume karịa ha?
Habakkuk 1:13 in English
Habakkuk 1:13 · Berean Standard Bible
Your eyes are too pure to look upon evil, and You cannot tolerate wrongdoing. So why do You tolerate the faithless? Why are You silent while the wicked swallow up those more righteous than themselves?
Context
11Mgbe ahụ, ha na-esi nʼebe ahụ gabiga dịka ifufe, na-agabigakwa
ndị mehierenụ, bụrụkwa ndị ikpe mara, ndị ike ha bụ chi ha.” 12Onyenwe anyị, Ọ bụ na ị dịghị site mgbe niile ebighị ebi?
Chineke m, na Onye Nsọ m, Ị gaghị anwụ.
Gị, Onyenwe anyị, họpụtara ha maka ikpe ikpe.
Gị, oke nkume m, emeela ka ha bụrụ ndị ga-enweta ahụhụ. 13Ma anya gị dị ọcha nke ukwuu, na ọ dịghị elekwasị ajọ ihe anya;
ị naghị anabatakwa mmegbu.
Ma gịnị mere i ji gba ndị aghụghọ nkịtị?
Gịnị mere i ji gba nkịtị mgbe ndị ajọ omume na-eloda
ndị bụ ndị ezi omume karịa ha? 14I meela ndị mmadụ ka ha dịrị ka azụ nke osimiri,
e, dịka anụ na-akpụ akpụ nke oke osimiri, nke na-enweghị onye na-achị ha. 15Onye iro nke ajọ omume juru obi, na-eji nko ya na-egbu ha.
Ọ na-ejikwa nko ụgbụ ya na-ejide ha.
Ọ na-achịkọta ha nʼụgbụ ya,
si otu a na-aṅụrị ọṅụ, ma na-etegharịkwa egwu ọṅụ.
Igbo text and audio: Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™, made available under an open license by Biblica, Inc.