Habakuk 1:11
Habakkuk 1:11 · Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020
Mgbe ahụ, ha na-esi nʼebe ahụ gabiga dịka ifufe, na-agabigakwa ndị mehierenụ, bụrụkwa ndị ikpe mara, ndị ike ha bụ chi ha.”
Habakkuk 1:11 in English
Habakkuk 1:11 · Berean Standard Bible
Then they sweep by like the wind and pass on through. They are guilty; their own strength is their god.”
Context
9Ha niile na-abịa ime ihe ike.
Ha ji ọsọ na-abịa dịka oke ifufe nke ọzara.
Ha na-abịa ịchịkọta ndị a dọtara nʼagha dịka ha bụ uzuzu. 10Ha na-akwa ndị eze emo,
jirikwa ndịisi ọchịchị na-eme ihe ọchị.
Ha na-achị ebe niile e wusiri ike ọchị,
na-ekpokọtakwa aja nʼazụ mgbidi niile ịlụta ha nʼagha. 11Mgbe ahụ, ha na-esi nʼebe ahụ gabiga dịka ifufe, na-agabigakwa
ndị mehierenụ, bụrụkwa ndị ikpe mara, ndị ike ha bụ chi ha.” 12Onyenwe anyị, Ọ bụ na ị dịghị site mgbe niile ebighị ebi?
Chineke m, na Onye Nsọ m, Ị gaghị anwụ.
Gị, Onyenwe anyị, họpụtara ha maka ikpe ikpe.
Gị, oke nkume m, emeela ka ha bụrụ ndị ga-enweta ahụhụ. 13Ma anya gị dị ọcha nke ukwuu, na ọ dịghị elekwasị ajọ ihe anya;
ị naghị anabatakwa mmegbu.
Ma gịnị mere i ji gba ndị aghụghọ nkịtị?
Gịnị mere i ji gba nkịtị mgbe ndị ajọ omume na-eloda
ndị bụ ndị ezi omume karịa ha?
Igbo text and audio: Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™, made available under an open license by Biblica, Inc.