Habakuk 1:12
Habakkuk 1:12 · Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020
Onyenwe anyị, Ọ bụ na ị dịghị site mgbe niile ebighị ebi? Chineke m, na Onye Nsọ m, Ị gaghị anwụ. Gị, Onyenwe anyị, họpụtara ha maka ikpe ikpe. Gị, oke nkume m, emeela ka ha bụrụ ndị ga-enweta ahụhụ.
Habakkuk 1:12 in English
Habakkuk 1:12 · Berean Standard Bible
Are You not from everlasting, O LORD, my God, my Holy One? We will not die. O LORD, You have appointed them to execute judgment; O Rock, You have established them for correction.
Context
10Ha na-akwa ndị eze emo,
jirikwa ndịisi ọchịchị na-eme ihe ọchị.
Ha na-achị ebe niile e wusiri ike ọchị,
na-ekpokọtakwa aja nʼazụ mgbidi niile ịlụta ha nʼagha. 11Mgbe ahụ, ha na-esi nʼebe ahụ gabiga dịka ifufe, na-agabigakwa
ndị mehierenụ, bụrụkwa ndị ikpe mara, ndị ike ha bụ chi ha.” 12Onyenwe anyị, Ọ bụ na ị dịghị site mgbe niile ebighị ebi?
Chineke m, na Onye Nsọ m, Ị gaghị anwụ.
Gị, Onyenwe anyị, họpụtara ha maka ikpe ikpe.
Gị, oke nkume m, emeela ka ha bụrụ ndị ga-enweta ahụhụ. 13Ma anya gị dị ọcha nke ukwuu, na ọ dịghị elekwasị ajọ ihe anya;
ị naghị anabatakwa mmegbu.
Ma gịnị mere i ji gba ndị aghụghọ nkịtị?
Gịnị mere i ji gba nkịtị mgbe ndị ajọ omume na-eloda
ndị bụ ndị ezi omume karịa ha? 14I meela ndị mmadụ ka ha dịrị ka azụ nke osimiri,
e, dịka anụ na-akpụ akpụ nke oke osimiri, nke na-enweghị onye na-achị ha.
Igbo text and audio: Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™, made available under an open license by Biblica, Inc.